Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 21:22 - Bible Nso

22 Devid we si Ọnan, Nyem ebe a, bú ebe-nzọcha-ọka nka, ka m'we wuere Jehova ebe-ichu-àjà nime ya: n'ego zuru ezu o ruru ka i gēnyem ya: ka ewe b͕ochie ihe-otiti a n'ebe ndi Israel nọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Devid sịrị ya, “Nye m ebe a, bụ ala ebe ịzọcha ọka gị, ka m nwee ike wuore Onyenwe anyị ebe ịchụ aja, ka akwụsị ọrịa a na-efe efe dakwasịrị ndị mmadụ. Resi m ya nʼọnụ ahịa o ruru.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 21:22
8 Iomraidhean Croise  

ka ọ we nyem ọb͕à Makpila, nke ọ nwere, nke di n'isi nke ọhia-ya n'ego zuru ezu o ruru ka ọ gēnyem ya n'etiti unu ka ọ buru ihe-onwunwe, nke gābu ala-ílì.


Ha biarue ebe-nzọcha-ọka nke Atad, nke di n'ofè Jọdan, ha we were iti-aka-n'obi di uku di kwa ike nke-uku ti aka n'obi n'ebe ahu: ọ we mere nna-ya oruru-újú ubọchi asa.


Arọna we si, Gini mere onye-nwem, bú eze, biakuteworo orù-ya? Devid we si, Izuru ebe-nzọcha-ọka-gi n'aka-gi, iwuru Jehova ebe-ichu-àjà, ka ewe b͕ochie ihe otiti a n'ebe ndi Israel nọ.


Ehab we gwa Nebot okwu, si, Nyem ubi-vine-gi, ka o we burum ubi ab͕ara ogige ebe anāku akwukwọ nri, n'ihi na nke ahu di nso n'akuku ulom; ka m'nye kwa gi ubi-vine di nma kari ya n'ọnọdu ya: ma ọ buru na ọ di nma n'anya-gi, ka m'nye gi ego ruru ọnu-ahia-ya.


Devid we biakute Ọnan, Ọnan we legide anya, hu Devid, si n'ebe-nzọcha-ọka-ya puta, kpọ isi ala nye Devid, kpuchie iru-ya n'ala.


Ọnan we si Devid, Were ya n'onwe-gi, ka onye-nwem, bú eze, me kwa ihe di nma n'anya-ya: le, enyewom gi ehi iji chu àjà-nsure-ọku, na ihe nzọcha-ọka ka ha buru nkú, na ọka wheat ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma; ihe nile ka m'nyeworo.


Ọ we guzo n'etiti ndi nwuru anwu na ndi di ndu, ewe b͕ochie ihe-otiti ahu.


soro nwoke Israel ahu ba nime ulo-ndina-ya, mapue ha abua, bú nwoke Israel ahu, na nwayi ahu rue ime-afọ-ya. Ewe b͕ochie ihe otiti ahu n'aru umu Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan