Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 21:2 - Bible Nso

2 Devid we si Joab, si kwa ndi-isi ndi Israel, Jenu, gua Israel ọnu site na Bia-sheba we rue Dan; wetaranum ọnu-ọgugu-ha ka m'we mara ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ya mere, Devid gwara Joab na ndịisi agha okwu sị, “Gaa gụọ ụmụ Izrel niile ọnụ, site na Bịasheba ruo Dan. Emesịa, bịa gwa m ihe ị gụtara ka m mata ole ọnụọgụgụ ha dị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 21:2
14 Iomraidhean Croise  

Abraham we bilie n'isi-ututu, were achicha na karama-akpukpọ miri nye Hega, tukwasi ya n'ubu-ya, ọ nye kwa ya nwa-ya, zilaga ya: ọ we je, nāwaghari n'ọzara Bia-sheba.


Ma anamadu ọdu ka achikọtasia Israel nile n'ebe i nọ site na Dan we rue Bia-sheba, dika ájá nke di n'akuku oké osimiri n'iba-uba: ka iru-gi nēje kwa n'agha ahu.


Jehova we tiye ajọ ọria nēfe efe n'aru Israel site n'ututu we rue na mb͕e ákàrà: orú nnù ndikom uzọ asatọ na nnù iri-na-ise we nwua n'etiti ndi Israel site na Dan we rue Bia-sheba.


ime ka ala-eze si n'ulo Sọl gabiga, na ime ka oche-eze Devid guzosie ike n'elu Israel na n'elu Juda, site na Dan we rue na Bia-sheba.


Juda na Israel we biri na ntukwasi-obi, nwoke ọ bula n'okpuru osisi vine ya na n'okpuru osisi fig ya, site na Dan we rue na Biasheba, ubọchi nile nke Solomon.


Ha we guzo okwu a, ikwusa n'Israel nile, site na Bia-sheba we rue Dan, ka ha bia imere Jehova, bú Chineke Israel, ememe ngabiga nime Jerusalem: n'ihi na ha emeghi ya dika edeworo ya n'akwukwọ n'ọtutu mb͕e gara aga.


Npako madu gēme ka ọ di ala: Ma onye mọ-ya di ala nējidesi nsọpuru ike.


N'ihi ọkika nke nkpughe ndia-n'ihi ya, ka ewe ghara iwelibigam ókè, enyerem ogwu n'anu-arum, bú mọ-ozi nke Setan, ka o we tiem aka, ka ewe ghara iwelibigam ókè.


Umu Israel nile we puta, ewe kpọkọta nzukọ Israel dika otù nwoke, site na Dan we rue Bia-sheba, ha na ala Gilead, n'ebe Jehova nọ na Mizpa.


Israel nile site na Dan we rue Bia-sheba we mara na emewo Samuel onye kwesiri okwukwe iburu Jehova onye-amuma.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan