Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 21:1 - Bible Nso

1 Setan we guzo imegide Israel, o we kpalie Devid iguta Israel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ekwensu biliri megide Izrel, mgbe ọ kpaliri Devid ka ọ gụọ Izrel ọnụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 21:1
18 Iomraidhean Croise  

Ndia ka amuru nye Rafa nime Gat; ha we da site n'aka Devid, na site n'aka ndi-orù-ya.


Joab nwa Zeruaia malitere iguta ha, ma ọ guzughi; iwe we dikwasi Israel n'ihi nka; etiyeghi kwa ọnu-ọgugu n'ọnu-ọgugu nke di n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke eze, bú Devid.


Ndia nile bu umu Asha, ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, ndi arọputara arọputa, ndi-dike bu dìnkpà, ha bu ndi-isi nke ndi-isi. Edewo kwa ha n'akwukwọ-osuso-ọmumu, nime usu-ndi-agha, n'ibu-agha, ọnu-ọgugu-ha bu orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù ise.


Ubọchi we di na umu Chineke biara iguzo onwe-ha n'iru Jehova, Setan we bia kwa n'etiti ha iguzo onwe-ya n'iru Jehova.


Mb͕e i nāguta ọnu-ọgugu umu Israel, dika ndi anāgukọta agukọta n'etiti ha si di, ha nile n'otù n'otù gēnye kwa Jehova ihe-nb͕aputa bayere nkpuru-obi-ha, mb͕e i nāgukọta ha; ka ihe-otiti we ghara idi n'etiti ha mb͕e i nāgukọta ha.


Ọ we me ka m'hu Joshua, bú onye-isi-nchu-àjà, ka ọ nēguzo n'iru mọ-ozi nke Jehova, na Setan, ka o nēguzo n'aka-nri-ya imegide ya.


Onye-ọnwunwa we biakute Ya, si Ya, Ọ buru na I bu Ọkpara Chineke, kwue ka nkume ndia ghọ ob͕e achicha.


Mb͕e O siri n'ebe ahu puta, ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi we malite inọgide Ya si-ike, na ikpasu Ya ikwu okwu bayere ọtutu ihe;


Saimon, Saimon, le, Setan riọtara unu, ka ọ yọcha unu dika ọka:


Mb͕e ha nēri nri-anyasi, mb͕e ekwensu tinyesiri ub͕u a n'obi Judas Iskariot, nwa Saimon, ka ọ rara Ya nye,


Ma Pita siri, Ananaias, n'ìhi gini ka Setan mejuru obi-gi igwa Mọ Nsọ okwu-ugha, na idebere onwe-gi ufọdu nime ọnu-aha nke iberibe ala gi?


ka ayi nātugharita kwa uche n'aru ibe-ayi ikpasu ihu-n'anya na ọlu ọma di iche iche;


Ka onye ọ bula ghara isi, mb͕e anānwa ya, Anēsite n'aka Chineke anwam: n'ihi na Chineke bu Onye anāpughi iwere ihe ọjọ nwa Ya, Ya onwe-ya adighi-anwa kwa onye ọ bula:


M'we nu oké olu ka ọ nādà n'elu-igwe, si, Ub͕u a ka ọ biaworo, bú nzọputa ahu, na ike ahu, na ala-eze Chineke-ayi, na ichi-isi nke Kraist-Ya: n'ihi na achudara onye ahu nke nēbo umu-nna-ayi ebubo, onye nēbo ha ebubo n'iru Chineke-ayi ehihie na abali.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan