Ma Amasa ka Absalom doro onye-isi usu-ndi-agha n'ọnọdu Joab. Ma Amasa bu nwa otù nwoke, aha-ya bu Itra onye Israel, onye bakuru Abigal nwa-nwayi Nehash, nwa-nne-nwayi nke Zeruaia nne Joab.
Amasa ka unu gāsi kwa, Ọ̀ bughi ọkpukpum na anu-arum ka i bu? Chineke mem otú a, mekwam ihe ọzọ otú a, ma ọ buru na i ghọghi onye-isi usu-ndi-agha n'irum ubọchi nile n'ọnọdu Joab.
Jehova gēme kwa ka ọbara-ya laghachi n'isi-ya, n'ihi na ọ dakwasiri ndikom abua bu ndi ezi omume na ndi di nma kari ya, o were mma-agha b͕ue ha, ma nnam, bú Devid, amaghi ya, bú Abnea nwa Nea, onye-isi usu-ndi-agha Israel, na Amasa nwa Jeta, onye-isi usu-ndi-agha Juda.
Ọzọ kwa, gi onwe-gi amawo ihe Joab nwa Zeruaia merem, ihe o mere ndi-isi abua nke usu-ndi-agha nile nke Israel, bú Abnea nwa Nea na Amasa nwa Jeta, na o b͕uru ha, we wusi ọbara agha n'udo, tiye ọbara agha n'ihe-ọkiké-ya nke di n'úkwù-ya, na n'akpukpọ-ukwu-ya nke di n'ukwu-ya abua.
Mọ nke Chineke we yiri Amasai, bú onye-isi ndi-ọchi-agha ahu, dika uwe, o we si, Nke gi ka ayi bu, Devid, n'akuku gi ka ayi nọ kwa, nwa Jesi: udo, udo diri gi, udo di-kwa-ra onye nēyere gi aka; n'ihi na Chineke-gi enyeworo gi aka. Devid we nara ha, me ha ndi-isi usu ndi nāpunara madu ihe.