Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 2:16 - Bible Nso

16 Umu-nne-ha ndinyom bu Zeruaia na Abigail. Umu-ndikom Zeruaia kwa; Abishai, na Joab, na Asahel, atọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Ọ mụkwara ụmụ nwanyị abụọ site nʼaka nwunye ya, ndị aha ha bụ Zeruaya na Abigel. Zeruaya mụrụ Abishai, na Joab, na Asahel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 2:16
11 Iomraidhean Croise  

Joab nwa Zeruaia we mara na obi eze di n'ebe Absolom nọ.


Ma Amasa ka Absalom doro onye-isi usu-ndi-agha n'ọnọdu Joab. Ma Amasa bu nwa otù nwoke, aha-ya bu Itra onye Israel, onye bakuru Abigal nwa-nwayi Nehash, nwa-nne-nwayi nke Zeruaia nne Joab.


Devid we si, Gini ka mu na unu nwekọrọ, umu-ndikom Zeruaia, na unu gāburum onye-nmegide ta? àgēme ka nwoke ọ bula nwua n'Israel ta? n'ihi na ọ̀ bu na amaghm na ta ka mu onwem bu eze Israel?


Joab nwa Zeruaia, na ndi-orù Devid, we pua, zute ha n'otù n'akuku ọdọ-miri Gibeon; ha we nọdu, ndi Devid n'otu akuku ọdọ-miri, na ndi Ish-boshet n'akuku nke-ọzọ nke ọdọ-miri.


Ma mu onwem akaghi aru ta, ọ bu ezie na abum onye etere manu ibu eze; ndikom ndia, bú umu Zeruaia, di kwa ike karim: Jehova kwughachi onye nēme ihe ọjọ dika ihe ọjọ ya si di.


Ma Abishai, bú nwa-nne Joab, onye ahu bu onye-isi ndikom atọ ahu: onye ahu feghari-kwa-ra ube-ya imegide ọgu ndikom iri-na-ise, ha we ghọ ndi eb͕uru eb͕u, o we nwe aha n'etiti ndikom atọ ahu.


na Ozem, bú nke-isi, na Devid, bú nke-asa:


Abigail mu-kwa-ra Amasa: ma nna Amasa bu Jeta onye Ishmael.


Devid we za, si Ahimelek, bú onye Het, si kwa Abishai nwa Zeruaia, bú nwa-nne Joab, si, Ònye gēsorom ridakuru Sọl, rue ọmuma-ulo-ikwū? Abishai we si, Mu onwem gēsoro gi rida.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan