Mb͕e O wepusiri ya, O welie Devid ibu eze-ha; onye Ọ b͕a-kwa-ra àmà, si, Achọtawom Devid nwa Jesi, nwoke nke di ka obim si achọ, onye gēme ihe nile M'nāchọ.
Jehova we si Samuel, Rùe ole mb͕e ka gi onwe-gi ganēruru Sọl újú, ebe Mu onwem juworo ya ka ọ ghara ibu eze Israel? b͕ajue manu na mpi-gi, je, M'gēziga gi jekuru Jesi onye Bet-lehem: n'ihi na ahutaworom onwem eze n'etiti umu-ya ndikom.