Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 19:6 - Bible Nso

6 Umu Amon we hu na ha emewo onwe-ha ka ha nēsi Devid ísì ọjọ, Hanun na umu Amon we ziga nnù talent ọla-ọcha abua na ọgu iri igotara onwe-ha ub͕ọ-ala na ndi-inyinya site na Mesọpọtemia, site kwa na Siria Meaka, site kwa na Zoba.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ma mgbe ndị Amọn chọpụtara na ha abụrụla ihe ịsọ oyi nʼebe Devid nọ, Hanọn na ndị Amọn zipụrụ otu puku talenti ọlaọcha iji gbazite ụgbọ agha na ndị na-agba ụgbọ agha site na Aram Naharaim, na Aram Maaka, nakwa Zoba.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 19:6
21 Iomraidhean Croise  

Jekob we si Simeon na Livai, Unu emekpawom aru, n'imem ka m'sì ísì n'etiti ndi bi n'ala nka, n'etiti ndi Kenean, na n'etiti ndi-Perizait: mu onwem kwa, ebe m'nwere ndikom ole-na-ole, ha gāchikọta onwe imegidem, tigbue m, agēme kwa ka m'tọb͕ọrọ n'efu, mu onwem na ulom


Umu Amon we hu na ha nēsì Devid ísì ọjọ, umu Amon we ziga, go Siria Bet-rehob na Siria Zoba, orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri ndi ji ukwu eje, na eze Meaka, ya na nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndikom Tob, bú orú nnù ndikom na nnù iri.


Devid tib͕u-kwa-ra Hedadeza nwa Rehob, bú eze Zoba, mb͕e ọ nēje iweghachi ike-ya n'akuku Osimiri.


Siria Damaskọs we bia iyere Hedareza, bú eze Zoba, aka, Devid we tib͕ue n'etiti ndi Siria orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri-na-ise.


Tou, bú eze Hemat, we nu na Devid etib͕uwo usu-ndi-agha nile nke Hedareza, bú eze Zoba;


Ewe je gosi Devid ihe bayere ndikom ahu. O we ziga izute ha; n'ihi na ihere nēme ndikom ahu nke-uku. Eze we si, Nọdunu na Jeriko rue mb͕e afu-ọnu-unu tolitere, mb͕e ahu ka unu gālata.


Ehab, bú eze Israel, we si Jehoshafat, bú eze Juda, Ì gēsom je Remot-gilead? Ọ we si ya, Dika m'di, otú a ka i di, ndim di kwa ka ndi-gi; ayi gānọye-kwa-ra gi n'agha ahu.


Eze Israel we chikọta ndi-amuma, bú nnù ndikom, si ha, Àyi gējeru Remot-gilead ibu agha, ma-ọbu #m'gārapu? Ha we si, Rigo; Chineke gēnye kwa ya n'aka eze.


Ma eze Israel na Jehoshafat, bú eze Juda, nānọkwasi, nwoke ọ bula n'oche-eze-ya, yiri uwe-ha, ha we nọdu n'ebe-nzọcha-ọka n'oghere ọnu-uzọ-ama Sameria; ndi-amuma nile nēbu kwa amuma n'iru ha.


O we were ọgu talent ọla-ọcha ise go orú nnù ndikom uzọ iri-na-abua na nnù iri, ha bu ndi-dike bu dìnkpà, site n'Israel.


Onye ahu buso-kwa-ra eze umu Amon agha, we ka ha ike. Umu Amon we nye ya n'arọ ahu ọgu talent ọla-ọcha ise, na orú nnù cor ọka wheat na nnù ise, na orú nnù cor ọka barley na nnù ise. Nka ka umu Amon nyeghachiri ya, n'arọ nke-abua kwa, na n'arọ nke-atọ.


Ha nile ewezugawo onwe-ha; ha ab͕aruwo n'otù dika miri; Ọ dighi onye nēme ezi ihe, ọ dighi ọbuná otù onye.


Nēme ka agha nile kwusi rue nsọtu uwa; Ọ nāb͕aji uta, b͕upia kwa ube; Ọ nēsure ub͕ọ-ala nile n'oku.


ha si ha, Jehova lekwasi unu anya, kpe ikpe: n'ihi na unu emewo ka ísì-ayi sì ísì ọjọ n'anya Fero, na n'anya ndi-orù-ya, itiye mma-agha n'aka-ha ib͕u ayi.


Onye nānu okwu-unu nānu okwu Mu onwem; onye nāju kwa unu nāju Mu onwem; ma onye nāju Mu onwem nāju Onye ziterem.


Ya mere onye nāju, ọ bughi madu ka ọ nāju, kama ọ bu Chineke, Onye nēnye Mọ Nsọ Ya ka Ọ ba nime unu.


Israel nile we nu, si, na Sọl tib͕uru ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia, na Israel aghọwo-kwa-ra ndi Filistia ihe nēsì ísì ọjọ. Ewe kpọkọta ndi Israel iso Sọl rue Gilgal.


Ma Sọl were ala-eze ahu, buru eze Israel, o we bue agha megide ndi-iro-ya nile buruburu, megide Moab, megide kwa umu Amon, megide kwa Edom, megide kwa ndi-eze Zoba, megide kwa ndi Filistia: ma n'ebe ọ bula ọ nēcheghari iru ọ nālub͕u ha.


Ekish we kwere Devid, si, Ọ mewo onwe-ya ka o sì ísì ọjọ nke-uku n'etiti ndi-ya, bú Israel; ọ gābu-kwa-ram orù mb͕e ebighi-ebi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan