Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 19:3 - Bible Nso

3 Ma ndi-isi umu Amon siri Hanun, Devid, ọ̀ nāsọpuru nna-gi n'anya-gi, na o ziteworo gi ndi-nkasi-obi? ọ̀ bughi ileputa ala-ayi, na ikwatu ya, na iledo ya, ka ndi-orù-ya biakutere gi?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 ndịisi ala Amọn sịrị Hanọn, bụ onyenwe ha, “Ị na-eche na Devid na-akwanyere nna gị ụgwụ site na izite ndị ozi ya ka ha bịa kasịe gị obi? Ọ bụ na ndị ozi ya abịakwuteghị gị, naanị ka ha mee nledo, nyochapụta otu obodo a dị ma kwatuo ya?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 19:3
12 Iomraidhean Croise  

Ma ndi-isi umu Amon siri Hanun, bú onye-nwe-ha, Devid, ọ́ nāsọpuru nna-gi n'anya-gi, na o ziteworo gi ndi-nkasi-obi? ọ̀ bughi ileputa obodo a, na iledo ya, na ikwatu ya, ka Devid zitere ndi-orù-ya ibiakute gi?


Devid we si, M'gēmere Hanun nwa Nehash ebere, n'ihi na nna-ya merem ebere. Devid we ziga ndi-ozi ikasi ya obi bayere nna-ya. Ndi-orù Devid we ba n'ala umu Amon jekuru Hanun, ikasi ya obi.


Hanun we were ndi-orù Devid, kọpu ha afu-ọnu, bipu kwa uwe-nwuda-ha n'etiti, rue otule-ha, we zilaga ha.


Umu Dan we si n'ab͕uru-ha ziga ndikom ise sitere n'ọnu-ọgugu-ha nile, bú ndi-dìnkpà, site na Zọra, site kwa n'Eshtaol, iledo ala ahu, na ileputa ya; ha we si ha, Jenu, leputanu ala ahu: ha we bia ugwu Efraim, rue ulo Maika, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu.


Ma ndi-isi ndi Filistia were iwe megide ya; ndi-isi ndi Filistia we si ya, Me ka nwoke a laghachi, ka o we laghachi n'ọnọdu-ya ebe i mere ka ọ buru onye-nlekọta-ya, ma ka ọ ghara iso ayi rida n'agha, ka o we ghara ighọrọ ayi onye-nmegide n'agha ahu: n'ihi na onye a gēji gini me ka ihe-ya tọ onye-nwe-ya utọ? ọ̀ gaghi-eji isi ndikom ndia?


Ekish we za, si Devid, Amawom na onye di nma n'anyam ka i bu, dika mọ-ozi Chineke: ọ bu nání na ndi-isi Filistia asiwo, Ọ gaghi-eso ayi rigo n'agha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan