Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 18:13 - Bible Nso

13 O we tiye ebe-nguzo-ndi-agha n'Edom; Edom nile we ghọrọ Devid ndi-orù. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula o jere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 O wuru ogige ndị agha nʼEdọm, ndị Edọm niile ghọrọ ndị na-ejere Devid ozi. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 18:13
19 Iomraidhean Croise  

Jehova we si ya, Mba abua di n'afọ-gi, Agēkewa kwa mba abua site n'úkwù-gi; Otù mba gēnwe ume kari mba ibe-ya; Nke-okenye gēfè nke-ntà.


Ka ndi di iche iche fè gi, Ka mba di iche iche kpọ isi ala nye gi: Buru onye nwere ike n'aru umunne-gi, Ka umu nke nne-gi kpọ kwa isi ala nye gi: Ka onye ọ bula nke nābu gi ọnu buru onye anābu ọnu, Ka onye ọ bula nke nāgọzi gi buru kwa onye agọziri agọzi.


Aisak we za, si Isọ, Le, edowom ya onye nwere ike n'aru gi, ọ bu kwa umunne-ya nile ka m'nyeworo ya ka ha buru ndi-orù-ya; ewerewokwam ọka na manya-vine ọhu me ka o guzosie ike: gini kwa ka m'gēmere gi, nwam?


Ọ bu kwa mma-agha-gi ka i gēji di ndu, ọ bu kwa nwa-nne-gi ka i gēfe; O gēru kwa, mb͕e, i gālù, ulù, Na i gētijipu yoke-ya n'olu-gi.


Ma Devid nọ n'ebe ahu ewusiri ike mb͕e ahu, ma ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di na Bet-lehem mb͕e ahu.


O rue, mb͕e Devid nọ n'Edom, mb͕e Joab, bú onye-isi usu-ndi-agha, rigoro ilì ndi eb͕uru eb͕u, na o tib͕uru nwoke ọ bula n'Edom;


Abishai nwa Zeruaia tib͕u-kwa-ra Edom nime Ndagwurugwu Nnù. orú nnù ndikom uzọ abua na nnù ise.


Devid we buru eze Israel nile; o we nēmere ndi-ya nile ihe ekpere m'ikpe na ezi omume.


Devid we tiye ebe-nguzo-ndi-agha nime Siria Damaskọs; Siria we ghọrọ Devid ndi-orù, nēbute onyinye-inata-iru-ọma. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula o jere.


Jehova gēdebe gi ka ihe ọjọ ọ bula ghara idakwasi gi; Ọ gēdebe nkpuru-obi-gi.


Ọ bu onye nēnye ndi-eze nzọputa: Onye nādọputa Devid, bú orù-Ya, n'ọnu mma-agha jọrọ njọ.


Edom gābu kwa ihe-nnweta, Sia gābu kwa ihe-nnweta, bú ndi-iro-ya; Israel nēme kwa ihe-dìnkpà.


Nime Damaskọs onye-isi ala nke nọ n'okpuru Aretas, bú eze, nēche obodo ndi Damaskọs nche, ijidem:


Emesia i gābiaru ugwu ntà Chineke, ebe ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di: ọ gēru kwa, mb͕e i biara n'ebe ahu rue obodo ahu, na i gēzute usu ndi-amuma ndi si n'ebe di elu ahu nārida; une na egwú-otiti na ọja na ubọ-akwara di kwa n'iru ha; ndi ahu ganēbu kwa amuma:


Jonatan we tib͕ue ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia nke di na Geba, ndi Filistia we nu ya. Sọl we fùa opì-ike n'ala ahu nile, si, Ka ndi-Hibru nu.


Ubọchi we rue mb͕e Jonatan nwa Sọl siri nwa-okorọbia nēbu ihe-agha-ya, Bia, ka ayi gabiga rue ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia, nke di n'ofè ọzọ ahu. Ma o gosighi nna-ya.


Devid we nēnwe uche n'uzọ-ya nile; Jehova nọye-kwa-ra ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan