Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 18:11 - Bible Nso

11 Ihe ndia ka eze, bú Devid, do-kwa-ra nsọ nye Jehova, tiyere ọla-ọcha na ọla-edo ahu nke o butere site na mba nile; site n'Edom, site kwa na Moab, site kwa n'umu Amon, site kwa na ndi Filistia, site kwa n'Amalek.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Eze Devid doro akụrụngwa ndị a niile nsọ nye Onyenwe anyị, dịka o mere ọlaọcha na ọlaedo o wetara na mba ndị a: Edọm, Moab, ndị Amọn, ndị Filistia na Amalek.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 18:11
20 Iomraidhean Croise  

Ewe jezue ozi nile nke eze, bú Solomon, jere n'ulo Jehova. Solomon we webata ihe nile Devid, bú nna-ya, doro nsọ, bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe nile, o we tiye ha n'ulo-àkù nke ulo Jehova.


Jehoash, bú eze Juda, we chiri ihe nsọ nile nke Jehoshafat, na Jehoram, na Ehazaia, nna-ya-hà, bú ndi-eze Juda, doro nsọ, na ihe nsọ ya nile, na ọla-edo nile anāchọta n'àkù nile nke ulo Jehova, na nke ulo eze, zigara Hazael, bú eze Siria: o we si na Jerusalem rigo.


o we zìe Hadoram nwa-ya jekuru eze, bú Devid, iju ya ajuju bayere udo-ya, na igọzi ya, n'ihi na o busoworo Hedareza agha, we tib͕ue ya; n'ihi na nwoke nke nēbuso Tou agha nke-uku ka Hedareza bu; ihe nile nke ọla-edo na nke ọla-ọcha na nke ọla di kwa n'aka Hadoram.


Abishai nwa Zeruaia tib͕u-kwa-ra Edom nime Ndagwurugwu Nnù. orú nnù ndikom uzọ abua na nnù ise.


Ma, le, na nwedam edoziworom ulo Jehova ọla-edo orú nnù talent uzọ iri-na-abua na nnù iri, na ọla-ọcha orú nnù talent ọgu uzọ isi na uzọ ise; ma ọla na ígwè enweghi ọtùtù; n'ihi na o riri nne: edoziwokwam osisi na nkume; i gātukwasi kwa ha ihe.


Nime ndi Livai, Ahaija bu onye-isi ulo-àkù nile nke ulo Chineke, ọbuná idebe ulo-àkù nile nke ihe nsọ nile.


Ma ònye ka mu onwem bu, òle ndi ka ndim bu kwa, na ayi nwere ike iwere afọ-ofufo nye Gi onwe-ayi otú a? n'ihi na n'ebe I nọ ka ihe nile si bia, ọ bu kwa ihe si n'aka-Gi bia ka ayi nyere Gi.


Ewe jezue ozi nile nke Solomon jere ulo Jehova. Solomon we webata ihe nile Devid, bú nna-ya, doro nsọ; bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe nile, o tiye ha n'ulo-àkù nke ulo Chineke.


Sinu n'etiti unu wetara Jehova àjà-nbuli: onye ọ bula nke obi-ya nwere afọ-ofufo, ya weta ya, bú àjà-nbuli nke Jehova; ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla;


Bilie, zọcha, gi ada Zaion: n'ihi na mpi-gi ka M'gēme ka ọ ghọ ígwè, ọ bu kwa ukwu-gi ka M'gēme ka ha ghọ ọla: i gāzọpia kwa ọtutu ndi di iche iche: M'gēwezuga kwa urù-ha nye Jehova, wezuga kwa àkù-ha nye Onye-nwe uwa nka nile.


Ma ọla-ọcha nile, na ọla-edo, na ihe nile nke ọla na ígwè, nsọ ka ha diri Jehova: ha gābà n'ulo-àkù Jehova.


Ha we sure obodo ahu n'ọku, na ihe nile nke di nime ya: nání ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe nile nke ọla na ígwè, ka ha tiyere n'ulo-àkù Jehova.


Devid we si ya, Ònye nwe gi? òle ebe i si bia kwa? Ọ si, Nwa-okorọbia Ijipt ka m'bu, m'buru kwa otù nwoke, bú onye Amalek, orù; onye-nwem we rapum, n'ihi na aru adighm ike ubọchi atọ gara aga.


Devid we chiri ìgwè ewu na aturu nile na ìgwè ehi; ha dupuru ha n'iru anu-ulo ndia, si, Nka bu ihe-nkwata Devid.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan