Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 17:9 - Bible Nso

9 M'gēdo-kwa-ra ndim, bú Israel, otù ebe, ku kwa ha dika osisi, ka ha we biri n'ọnọdu-ha, ghara ima jijiji ọzọ; umu ajọ omume agaghi-eme kwa ha ọzọ ka ha nāka nká ngwa ngwa, dika na mbu,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Aga m ahọpụta otu ebe nʼihi ndị m Izrel, kụkwa ha dịka osisi ka ha biri nʼebe obibi nke aka ha, ka ha ghara ị bụkwa ndị a na-esogbu ọzọ. Ndị ajọ mmadụ agaghị emegbukwa ha dịka ha mere na mbụ,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 17:9
21 Iomraidhean Croise  

na dika site n'ubọchi mb͕e M'nyere ndi-ikpe iwu ibu ndi-isi ndim, bú Israel: emewokwam ka ndi-iro-gi nile ruru ala. Anamegosi kwa gi na Jehova gēwuru gi ulo.


M'we nọyere gi n'ebe ọ bula i jere, ebipu-kwa-ram ndi-iro-gi nile n'iru gi; M'gēme-kwa-ra gi aha, dika aha ndi uku ndi nọ n'uwa.


Gi onwe-gi jiri aka-gi napu mba ọzọ di iche iche ala-ha, we kua ha dika osisi nime ya; I nēmejọ ndi nile di iche iche, we me ka nna-ayi-hà wasa alaka.


Onye-iro agaghi-abiakwasi ya na mberede; Ọzọ, nwa nke ajọ omume agaghi-eweda ya n'ala.


Ndi akuworo n'ulo Jehova dika osisi Gāma akwukwọ n'ogige nile nke Chineke-ayi.


O rue, n'ọtutu ubọchi ahu, na eze Ijipt nwuru: umu Israel we nēze ume n'ihi òfùfè-ha, ha we tie nkpu, ntiku ha tikuru Chineke we rigorue Chineke nti, n'ihi òfùfè ahu.


Umu-gi emewo ngwa; ndi nākwada gi na ndi nēme ka i tọb͕ọrọ n'efu gēsi nime gi pua.


Agaghi-anu kwa ihe-ike ọzọ n'ala-gi, agaghi-anu nbibi na ntipia n'ókè-ala-gi nile; ma i gākpọ mb͕idi-gi nile Nzọputa, kpọ kwa ọnu-uzọ-ama-gi nile Otuto.


idoro ndi Zaion nēru újú, inye ha ihe ọma ike n'isi n'ọnọdu ntu, manu obi-utọ n'ọnọdu iru-újú, ákwà-nb͕okwasi otuto n'ọnọdu mọ nke inyoghi-inyoghi; ka enwe kpọ ha osisi oak nke ezi omume, ihe-ọkukú nke Jehova, ime ka ọ ma nma.


N'ihi na M'gātukwasi ha anyam ime ha nma, M'gēme kwa ka ha lata n'ala nka: M'gēwu kwa ha dika ulo, ghara ikwada ha; M'gāku kwa ha dika osisi, ghara iropu ha.


Obi gātọkwam utọ n'aru ha ime ha nma, M'gēji kwa obim nile, ji kwa nkpuru-obim nile, kua ha n'ala nka n'ezie dika osisi.


i jiwo amam-ihe-gi, ji kwa nghọta-gi, lutara onwe-gi àkù, i we luta ọla-edo na ọla-ọcha n'àkù-gi nile:


M'gēme kwa ka ha si na ndi nile di iche iche puta, M'gāchikọputa kwa ha n'ala nile, me ka ha ba n'ala-ha; M'gāzù kwa ha n'ugwu nile nke Israel, na n'akuku ebe nile miri si erù, na n'ebe-obibi nile nke ala-ha.


Ha gēbi kwa n'ala ahu nke M'nyeworo orùm, bú Jekob, nke nna-unu-hà biri nime ya; ha gēbi kwa nime ya, ha onwe-ha, na umu-ha, na umu umu-ha, rue mb͕e ebighi-ebi: Devid, bú orùm, gābu-kwa-ra ha onye-isi rue mb͕e ebighi-ebi.


M'gāku kwa ha n'elu ala-ha, agaghi-eropu kwa ha ọzọ n'ala-ha nke M'nyeworo ha; otú a ka Jehova, bú Chineke-gi, siri.


Unu ekwela ka onye ọ bula were okwu efu rafue unu: n'ihi na ọ bu n'ihi ihe ndia ka iwe Chineke nābiakwasi umu nke ekwenyeghi-ekwenye.


Ọ gēhichapu kwa anya-miri nile ọ bula n'anya-ha; ọnwu agaghi-adi kwa ọzọ; iru-újú ma-ọbu ikwa-ákwá ma-ọbu aru-ufu agaghi-adi kwa ọzọ: ihe ngbu nile agabigawo.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan