Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 17:27 - Bible Nso

27 ma ub͕u a I kwerewo igọzi ulo orù-Gi, ka o we dirue mb͕e ebighi-ebi n'iru Gi: n'ihi na Gi onwe-gi, Jehova, agọziwo, o we buru ihe agọziri agọzi rue mb͕e ebighi-ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Ugbu a, ọ masịrị gị ịgọzi ụlọ ohu gị, ime ka ọ dịrị na-aga nʼihu gị ruo mgbe ebighị ebi, nʼihi na gị Onyenwe anyị, agọziela ya. Ọ ga-abụkwa ihe a gọziri agọzi ruo mgbe ebighị ebi.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 17:27
12 Iomraidhean Croise  

Aisak we ma jijiji nke-uku nke-uku, si Ònye kwa bu onye ahu nke chutaworo anu-nchuta, buterem, m'we rie ufọdu nime nri ahu nile tutu i bia, m'we gọzie ya? onye agọziri agọzi ka ọ gābu kwa.


Ọbara-ha gālaghachi kwa n'isi Joab, na n'isi nkpuru-ya rue mb͕e ebighi-ebi: ma udo gādiri Devid, di-kwa-ra nkpuru-ya, di-kwa-ra ulo-ya, di-kwa-ra oche-eze-ya, rue mb͕e ebighi-ebi, site na Jehova.


Ma eze, bú Solomon, bu onye agọziri agọzi, agēme kwa ka oche-eze Devid guzosie ike n'iru Jehova rue mb͕e ebighi-ebi.


Ma ub͕u a, Jehova, Gi onwe-gi bu Chineke onwe-ya, I gwawo kwa orù-Gi ezi ihe a:


O rue, mb͕e nka gasiri, na Devid tib͕uru ndi Filistia, me kwa ka ha ruru ala, o we nara n'aka ndi Filistia Gat na umu-obodo-ya.


Ma Jehova, bú Chineke Israel, rọputaram n'etiti ulo nile nke nnam ibu eze Israel rue mb͕e ebighi-ebi: n'ihi na Juda ka Ọ rọputara ibu onye-ndú; ma n'ulo Juda Ọ rọputara ulo nnam; ma n'etiti umu-ndikom nnam ihem tọrọ Ya utọ imem ka m'buru eze Israel nile:


N'ihi na I nēme ya ka ọ buru ngọzi rue mb͕e ebighi-ebi: I nēwere ọṅù me ka ọ ṅuria n'iru Gi.


Ka aha-Ya dirue mb͕e ebighi-ebi; N'iru anyanwu ka aha-Ya gāmu ọmùmù: Madu gāgọzi kwa onwe-ha nime ya: Mba nile gākpọ ya onye ihe nāgara nke-ọma.


Le, ọ bu igọzi ka m'nataworo iwu: Ọ gọziwo kwa, apughkwam itughari ya.


N'ihi na nchèghari adighi n'onyinye-amara nile na ọkpukpọ nke Chineke.


Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye were ngọzi nile ọ bula nke Mọ Nsọ gọzie ayi n'ebe di n'elu-igwe nime Kraist:


N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi, dika Ọ gwara gi okwu: i gānara kwa ọtutu mba ihe-ibe, ma gi onwe-gi agaghi-ab͕a ihe n'ibe; i gāchi kwa ọtutu mba, ma ha agaghi-achi gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan