Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 17:24 - Bible Nso

24 Ka eme kwa ka ọ buru ihe kwesiri ntukwasi-obi, ka aha-Gi di kwa uku rue mb͕e ebighi-ebi, si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, bu Chineke Israel nwere: agēme kwa ka ulo Devid, bú orù-Gi, guzosie ike n'iru Gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 ka o nwee ike guzosie ike. Ka aha gị bụrụ ihe dị ukwuu ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe ahụ ndị mmadụ ga-asị, ‘Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke na-achị Izrel, bụ Chineke Izrel.’ A ga-emekwa ka ụlọ ohu gị Devid guzosie ike nʼihu gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 17:24
17 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a, Jehova, okwu ahu nke I kwuworo bayere orù-Gi, baye-kwa-ra ulo-ya, ka eme ya ka o guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi, Gi me kwa dika I kwuworo.


N'ihi na Gi onwe-gi, Chinekem, ekpughewo nti orù-Gi, si na I gēwuru ya ulo: n'ihi nka orù-Gi nwetara obi-ike ikpe ekpere n'iru Gi.


Gi onwe-gi si kwa n'elu-igwe, site n'ọnọdu obibi-Gi guzosiri ike, nuru, me dika ihe nile si di nke onye ala ọzọ ahu nākpọku Gi; ka ndi nile nke uwa we mara aha-Gi, itu egwu Gi, dika ndi-Gi, bú Israel, si eme, na imara na akpọkwasiri aha-Gi n'ulo a nke M'wuworo.


Jehova, me Onwe-gi ka I di elu n'ike-Gi: Ayi gābù abù, bùku kwa idi-ike-Gi abù ọma.


Ihe agọziri agọzi ka aha nsọpuru Ya bu kwa rue mb͕e ebighi-ebi; Ka uwa nile juputa kwa na nsọpuru-Ya. Amen, na Amen.


Ka idi-utọ nke Onye-nwe-ayi, bú Chineke-ayi, dikwasi ayi: Gi me kwa ka ọlu aka-ayi guzosie ike n'aru ayi; E, ọlu aka-ayi, me ka o guzosie ike.


Na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), M'gāburu ab͕uru nile nke Israel Chineke, ndi ahu gābu-kwa-ram otù ndi.


Jeremaia we si Zedekaia, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, siri: Ọ buru na i gāpukuru ndi-isi eze Babilon n'ezie, nkpuru-obi-gi gādi kwa ndu, agaghi-esure kwa obodo a n'ọku; i gādi kwa ndu, gi onwe-gi na ulo-gi:


Ewebàla ayi nime ọnwunwa, kama dọputa ayi n'aka ajọ onye ahu.


Ya mere, kpenu ekpere otú a: Nna-ayi Nke bi n'elu-igwe, Ka edo aha-Gi nsọ.


Nna, nye aha-Gi otuto. Ya mere otù olu sitere n'elu-igwe da, si, Enyerem ya otuto, M'gēnye kwa Ya otuto ọzọ.


Okwu ndia ka Jisus kwuru: O we welie anya-Ya le elu-igwe, si, Nnam oge hour abiawo; nye Ọkpara-Gi otuto, ka Ọkpara-Gi we nye Gi Otuto:


ka ire nile ọ bula we kwuputa kwa na Jisus Kraist bu Onye-nwe-ayi, ka ewe nye Chineke, bú Nna, otuto.


Ma otú ọ di ub͕u a ha nāb͕aso ala ka nma, nke ahu bu, ala di n'elu-igwe: n'ihi nka ihere ha adighi-eme Chineke, ka akpọ Ya Chineke-ha: n'ihi na O doziworo ha otù obodo.


N'ihi na nka bu ọb͕ub͕a-ndu nke Mu na ulo Israel gāb͕a Mb͕e ubọchi nile ahu gasiri, ka Onye-nwe-ayi kwuru; M'gētiye iwum n'uche-ha, Ọ bu kwa n'obi-ha ka M'gēdekwasi ha dika n'akwukwọ: M'gābu-kwa-ra ha Chineke, Ha onwe-ha gābu-kwa-ram otù ndi:


ọ buru na onye ọ bula nēkwu okwu, ya kwue dika okwu nke si Chineke n'ọnu puta; ọ buru na onye ọ bula nēje ozi, ya je dika o sitere n'ike ahu Chineke nēnyezu: ka ewe nye Chineke otuto n'ihe nile site n'aka Jisus Kraist, Onye nwe ebube nile na ike nile rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


M'we nu oké olu ka ọ nēsi n'oche-eze ahu dà, si, Le, ūlọ-ikwū nke Chineke diyere madu, Ọ gēbiye-kwa-ra ha, ha onwe-ha gābu kwa ndi nke Ya, Chineke Onwe-ya gānọye-kwa-ra ha, buru kwa Chineke-ha:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan