Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 17:12 - Bible Nso

12 Onye ahu gēwurum ulo, M'gēme kwa ka oche-eze-ya guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ọ bụ ya onwe ya ga-ewuru m ụlọ, aga m emekwa ka ocheeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 17:12
21 Iomraidhean Croise  

Ma, le, m'nāsi na m'gēwuru aha Jehova, bú Chinekem, ulo, dika Jehova gwara Devid, bú nnam, okwu, si, Nwa-gi, onye M'gētiyekwasi n'oche-eze-gi n'ọnọdu gi, ya onwe-ya gēwuru aham ulo.


otú ọ di, gi onwe-gi agaghi-ewu ulo ahu: kama, nwa-gi nwoke nke nēsi n'úkwù-gi puta, onye ahu gēwuru aham ulo.


Ọ gēru kwa, mb͕e ubọchi-gi zuru ijeso nna-gi-hà, na M'gēme ka o bilie, bú nkpuru-gi nke gānọchi gi, onye gēsite n'umu-gi ndikom; M'gēme kwa ka ala-eze-ya guzosie ike.


Mu onwem gāburu ya nna, ya onwe-ya gābu-kwa-ram nwa: M'gaghi-ewezuga kwa eberem n'ebe ọ nọ, dika M'wezugara ya n'ebe ọ nọ, bú onye buru gi uzọ:


Ma otú a ka ha zaghachiri ayi okwu, si, Ayi onwe-ayi bu ndi-orù nke Chineke nke elu-igwe na uwa, ayi nēwu kwa ulo nke ewuru ọtutu arọ gara aga site na mb͕e a, nke otù eze uku nke Israel nwere wuru, wuzu kwa.


Ka aha-Ya dirue mb͕e ebighi-ebi; N'iru anyanwu ka aha-Ya gāmu ọmùmù: Madu gāgọzi kwa onwe-ha nime ya: Mba nile gākpọ ya onye ihe nāgara nke-ọma.


M'gēme kwa ka nkpuru-ya dirue mb͕e ebighi-ebi, Me kwa ka oche-eze-ya di ka ubọchi nile nke elu-igwe.


Rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gēme ka nkpuru-gi guzosie ike, M'gēwu kwa oche-eze-Gi rue ọb͕ọ nile. Selah


Elu-igwe gēkele kwa oké ọlu-Gi, Jehova; Kele kwa ikwesi-ntukwasi-obi-Gi nime nkpọkọta nke ndi nsọ.


Ọ dighi ọgwugwu ọ bula iba-uba nke ibu-onye-isi-Ya na udo-Ya gāgwu, n'elu oche-eze Devid, na n'elu ala-eze-ya, ime ka o guzosie ike, na ikwagide ya n'ikpé ziri ezi na n'ezi omume, site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi. Ekworo Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēme nka.


Ma n'ubọchi-ha, bú eze ndia, ka Chineke nke elu-igwe gēme ka otù ala-eze bilie, nke agaghi-emebi emebi rue mb͕e abighi-ebi, ọ bu kwa ọbubu-eze-ya ka anāgaghi-arapuru ndi ọzọ; ọ gētipia ala-eze ndia nile me ka ha gwusia, ma ya onwe-ya gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi.


N'ihi na Ọ ghaghi ibu eze, rue mb͕e Ọ gēdebewori ndi-iro-Ya nile n'okpuru ukwu-Ya.


n'ihi na nime Ya ka ozuzù nile nke ihe Chineke bu nēbigide nēwere aru madu,


Mọ-ozi nke-asa we fùa opì; oké olu we da n'elu-igwe, ha we si, Ala-eze nke uwa aghọwo ala-eze nke Onye-nwe-ayi, na nke Kraist-Ya: Ọ gābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan