Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 16:40 - Bible Nso

40 isurere Jehova àjà-nsure-ọku n'elu ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku mb͕e nile n'ututu na n'anyasi, ọbuná dika ihe nile si di nke edeworo n'iwu Jehova, nke O nyere Israel n'iwu;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

40 Nʼihi ịchụ aja nsure ọkụ mgbe niile nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị, ụtụtụ na anyasị niile nʼusoro dịka e si dee ya nʼakwụkwọ iwu Onyenwe anyị, nke o nyere ndị Izrel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 16:40
11 Iomraidhean Croise  

Zedok nwa Ahaitub, na Ahimelek nwa Abaiata, bu ndi-nchu-àjà; Seraia bu ode-akwukwọ;


O rue, mb͕e etiti-ehihie gasiri, na ha nēbu amuma rue mb͕e nsure onyinye-inata-iru-ọma; ma ọ dighi olu di, ọ dighi kwa onye nāza, ọ dighi kwa ọṅuṅa-nti di.


Le, mu onwem nēwuru aha Jehova, bú Chinekem, ulo, idoro Ya nsọ, isure n'iru Ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, na idebe n'ebe ahu achicha anēdo n'usoro mb͕e nile, na isure àjà-nsure-ọku n'ututu na n'anyasi, na n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile, na mb͕e nile akara àkà nke Jehova, bú Chineke-ayi. Rue mb͕e ebighi-ebi ka nka dikwasi Israel.


O guzo-kwa-ra òkè eze sitere n'àkù-ya iji chu àjà-nsure-ọku, bú àjà-nsure-ọku nke ututu na nke anyasi, na àjà-nsure-ọku anāchu n'ubọchi-izu-ike nile, na nke anāchu n'ọnwa ọhu nile, na nke anāchu na mb͕e nile akara àkà, dika edeworo ya n'iwu Jehova.


Ha we me ka ebe-ichu-àjà guzosie ike n'ebe-ndọkwasi-ya nile; nihi na oké ujọ di n'aru ha n'ihi ndi ala ahu nile: ha we surere Jehova àjà-nsure-ọku n'elu ya, bú àjà-nsure-ọku anēsure ututu na anyasi.


e, mb͕e mu onwem nọ nēkwu okwu n'ekpere, onye ahu, bú Gebriel, onye m'hururi n'ọhù n'isi-nmalite, ebe emere ka o feb͕ue onwe-ya n'ufe, o we nērutum aru n'ihe dika mb͕e onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi.


Ọ weta kwa nso onyinye-inata-iru-ọma, si nime ya meju ọbu-aka-ya, sure ya ibu ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà, tiyere àjà-nsure-ọku nke ututu.


Bianu na Bet-el, jehie; bianu na Gilgal, me ka njehie ba uba; chibata-kwa-nu ihe-àjà-unu kwa-ututu, chibata ihe nile bu otù uzọ n'uzọ iri unu kwa ubọchi atọ;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan