Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 16:36 - Bible Nso

36 Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke Israel, bu, Site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi. Ndi Israel nile we si, Amen, ha we to Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

36 Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. Mgbe ahụ, mmadụ niile sịrị, “Amen” na “Toonu Onyenwe anyị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 16:36
12 Iomraidhean Croise  

Ọ si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye were ọnu-Ya gwa Devid, bú nnam, okwu, were kwa aka-Ya mezue ya, si,


Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye nyeworo ndi-Ya, bú Israel, izu-ike, dika ihe nile nke O kwuru si di: ọ dighi otù okwu dapuru n'okwu-Ya nile di nma, nke O kwuru n'aka Moses, bú orù-Ya.


Ezra we gọzie Jehova, bú Chineke uku. Ndi ahu nile we za, si, Amen, Amen, n'ichili aka-ha elu: ha we rube isi-ha, kpọ isi ala nye Jehova, kpue iru-ha n'ala.


Ndi Livai, bú Jeshua, na Kadmiel, na Bani, na Hashabneia, na Sherebia, na Hodia, na Shebania, na Petahia, we si, Bilienu, gọzie Jehova, bú Chineke-unu, site na mb͕e edighi-ebi rue mb͕e ebighi-ebi: ka ha gọzi kwa aha-Gi di nsọpuru, nke ebuliworo ya elu kari ngọzi na otuto nile.


Zọputa ayi, Jehova, bú Chineke-ayi, Chikọputa kwa ayi n'etiti mba nile Ikele aha nsọ Gi, Na inya isi n'otuto-Gi.


Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke Israel, bu, Site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi. Ka ndi Israel nile si kwa, Amen. Tonu Ja.


o we si, bú Jeremaia onye-amuma, Amen: Jehova me otú a: Jehova me ka okwu-gi nile guzosie ike, bú nke i buworo amuma, ime ka ihe nile nke ulo Jehova, na ndi nile emere ka je biri n'ala ọzọ, si na Babilon lata n'ebe a.


Ma emeghi otú a, onye nọ n'ọnọdu onye nāmutaghi akwukwọ gēsi aṅa si Amen ahu mb͕e i nēkele ekele, ma ọ buru na i ji mọ-gi nāgọzi, ebe ọ nāmataghi ihe ọ bula i nēkwu?


Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye were ngọzi nile ọ bula nke Mọ Nsọ gọzie ayi n'ebe di n'elu-igwe nime Kraist:


Onye agọziri agọzi ka Ọ bu, bú Chineke na Nna nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, Onye muru ayi ọzọ, dika oké ebere-Ya si di, ka ayi we nwe olile-anya di ndu, site na nbilite ahu nke Jisus Kraist si na ndi mwuru anwu bilite,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan