O we si ha, Jerenu onwe-unu, rie ihe mara abuba, ṅua ihe-ọṅuṅu di utọ, were òkè zigara ndi ọ nādighi ihe edoziworo ha: n'ihi na nsọ ka ubọchi ta diri Onye-nwe-ayi: ihe ewuta-kwa-la unu; n'ihi na ọṅù Jehova bu ike-unu.
M'we hu ihe di ka ib͕u-maramara amber, ihe di ka ọku si di n'ile ya anya nke di nime ya buruburu, site n'ihe bu úkwù-ya n'ile ya anya we rigo elu; ọzọ, site n'ihe bu úkwù-ya n'ile ya anya we ridata ahurum ihe nke di ka ọku si di n'ile ya anya, onwunwu-ọku di-kwa-ra ya buruburu.
Nna, ihe I nyeworom, anamachọ ka, ebe Mu onwem nọ, ka Mu na ndi ahu nọ kwa; ka ha we hu otutom, nke I nyeworom: n'ihi na I hurum n'anya mb͕e akātọghi ntọ-ala uwa.