Ma ub͕u a me ka nwunye nwoke ahu laghachi; n'ihi na onye-amuma ka ọ bu, ọ gēkpe kwa ekpere bayere gi, i we di ndu: ma ọ buru na i meghi ka ọ laghachi, gi mata na i ghaghi inwu anwu, gi onwe gi, n'ihe nile inwere.
Unu onwe-unu kwa, otite-manu ahu nke unu natara n'aka-Ya nādigide nime unu, ọ dighi kwa unu nkpà ka onye ọ bula zí unu ihe; kama dika otite-manu-Ya nēzí unu ihe bayere ihe nile, dika ọ bu kwa ezie, nābughi kwa okwu-ugha, dika O zíkwara unu, nānọgidenu nime Ya.