M'gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum guzosi ike n'etiti Mu na gi na nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, rue ọb͕ọ-ha nile, ka ọ buru ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi, na M'gāburu gi, buru kwa nkpuru-gi, ndi gānọchi gi, Chineke.
Chineke, ọ bu Chinekem ka I bu; anamachọsi Gi ike: Akpiri Gi akpọwo nkpuru-obim nku, anu-arum achọsiwo Gi ike, N'ala ọkpọ-nku na nke ida-#mbà, ebe miri nādighi.
Na nkpuru-obim ka akpiri Gi nātim n'abali; e, mọm nke di nimem ka m'gēji chọsie Gi ike: n'ihi na mb͕e ikpé-Gi nile nādakwasi uwa, ezi omume ka ndi bi n'elu-uwa dum madu bi mutaworo.