Devid we si ndi-isi ndi Livai ka ha me umu-nne-ha, bú ndi-ọbù-abù, ka ha guzo chiri ihe abù, bú une, na ubọ-akwara, na ájà, nēme ka anu udà-ha, iweli olu n'elu n'ihi ọṅù.
tiye-kwa-ra ha umu-nne-ha, bú ndi nke usoro nke-abua, Zekaraia, na Ben, na Jaaziel, na Shemiramot, na Jehiel, na Uni, na Elaiab, na Benaia, na Maaseia, na Matitaia, na Elifelehu, na Mikneia, na Obed-edom, na Jeiel, bú ndi-ọnu-uzọ-ama.
ha bu: Esaf, bú onye-isi, na Zekaraia, bú onye nke-abua ya, na Jeiel, na Shemiramot, na Jehiel, na Matitaia, na Elaiab, na Benaia, na Obede-edom, na Jeiel, chiri une na ubọ-akwara; Esaf nēwere kwa ájà me ka anu udà-ha;
Devid na ndi-isi usu-ndi-agha we kewaputara òfùfè ufọdu nime umu Esaf, na nke Himan, na nke Jedutun, ndi nēwere ubọ-akwara, na une, na ájà, bu amuma: ọnu-ọgugu-ha, bú ndikom nēje ozi dika òfùfè-ha si di, we di:
Ndia nile nọ n'aka nna-ha n'ibù abù n'ulo Jehova, chiri ájà, na une, na ubọ-akwara, iji fè òfùfè nke ulo Chineke; ha nọ n'aka eze, bú Esaf, na Jedutun, na Himan.
Ndi-nchu-àjà nēguzo kwa, dika ihe-ndebe-ha si di; ha na ndi Livai, ndi chiri ihe abù Jehova, nke Devid, bú eze, mere ikele Jehova, n'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di, mb͕e Devid nēto Chineke site n'aka-ha: ndi-nchu-àjà nāfù kwa opì n'iru ha; Israel nile nēguzo kwa.