Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 13:2 - Bible Nso

2 Devid we si nkpọkọta nile nke Israel, Ọ buru na ọ di unu nma, ọ buru kwa na o sitere na Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi zisara umu-nne-ayi ozi n'ebe nile, bú ndi fọduru n'ala nile nke Israel, ha na ndi-nchu-àjà na ndi Livai ndi bi n'obodo ebe-ita-nri nile ha, ka ha we chikọta onwe-ha n'ebe ayi nọ:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ọ gwara ọgbakọ Izrel niile ahụ sị, “Ọ bụrụ na ọ dị unu mma, ọ bụrụkwa na ọ bụ ọchịchọ Onyenwe anyị Chineke anyị, ka anyị ziga ozi zie ụmụnna anyị niile bi nʼakụkụ niile nke ala Izrel, na ndị nchụaja na ndị Livayị niile, bi nʼobodo ha na ndị bi nʼebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, ka ha bịa, soro anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 13:2
16 Iomraidhean Croise  

Ha we gwa ya okwu, si, Ọ buru na i ghọrọ ndi nka orù ta, we fè ha òfùfè, za ha, gwa ha okwu di nma, ha gāghọ-kwa-ra gi orù ubọchi nile.


ma Jehoram, bú eze, laghachiri ka agwọ ya nime Jezreel na ntib͕u nke ndi Siria tib͕uru ya, mb͕e o nēbuso Hazael, bú eze Siria, agha.) Jihu we si, Ọ buru na nka bu uche-unu, ka onye-nb͕apu ghara isi n'obodo a pua ije igosi ya nime Jezreel.


Ndikom Israel nile ndi nọ na ndagwurugwu ahu we hu na ha ab͕alagawo, na Sọl na umu-ya ndikom anwuwo kwa, ha we rapu obodo nile ha b͕alaga; ndi Filistia we bia biri nime ha.


Devid we me ka ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na usu nile nke ọgu ndikom ise dua ya ọdu, bú onye-ndú ọ bula.


ka ayi bughachi kwa ib͕e Chineke-ayi n'ebe ayi nọ: n'ihi na ayi achọghi ya n'ubọchi Sọl.


Ọ buru na ihe a ka i gēme, ọ buru kwa na Chineke enye gi iwu, i gēnwe kwa ike iguzo; ọzọ kwa, ndi nka nile gābà kwa n'ọnọdu-ha n'udo.


Nmebi èchìchè nile di mb͕e ìzù nzuzo nādigh: Ma n'ọtutu ndi nādu ọdu ka ha nēguzosi ike.


Eleghi anya Jehova, bú Chineke-gi, gānu okwu nile nke Rabshake, onye eze Asiria, bú onye-nwe-ya, ziteworo ita Chineke di ndu uta, eleghi anya Ọ gābara okwu nile nke Jehova, bú Chineke-gi, nuworo nba: gi buli kwa ekpere-gi n'ihi ndi fọduru ndi ahutaworo.


Ma ndi Filistia nēbuso Israel agha: ndikom Israel we b͕alaga n'iru ndi Filistia, ha we da, buru ndi eb͕uru eb͕u n'ugwu Gilboa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan