1 Ihe E Mere 13:1 - Bible Nso1 Devid we me ka ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na usu nile nke ọgu ndikom ise dua ya ọdu, bú onye-ndú ọ bula. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a1 Devid na ndịisi agha ya na-achị imerime puku ndị agha, na ọtụtụ narị ndị agha, zukọrọ gbaa izu. Faic an caibideil |
Ọzọ kwa, ndi bi ha nso, rue Isaka na Zebulun na Naftali, nēweta achicha n'elu inyinya-ibu na n'elu camel, na n'elu inyinya mule, na n'elu ehi, ihe-oriri nke utu ọka, na mbadamba fig, na uyọkọ nkpuru-vine amiri ami, na manya-vine, na manu, na ìgwè ehi, na ìgwè ewu na aturu n'uba: n'ihi na ọṅù di n'Israel.