Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 13:1 - Bible Nso

1 Devid we me ka ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na usu nile nke ọgu ndikom ise dua ya ọdu, bú onye-ndú ọ bula.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Devid na ndịisi agha ya na-achị imerime puku ndị agha, na ọtụtụ narị ndị agha, zukọrọ gbaa izu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 13:1
12 Iomraidhean Croise  

Devid we chikọta kwa ndikom nile arọputara arọputa n'Israel, orú nnù madu uzọ atọ na nnù iri-na-ise.


Eze we ziga, ha we chikọta ndi-okenye nile nke Juda na Jerusalem n'ebe ọ nọ.


Ndia, ndi sitere n'umu Gad, bu ndi-isi usu-ndi-agha: onye kachasi ntà ra ka ọgu ndikom ise, onye kachasi uku ra kwa ka nnù ndikom abua na ọgu iri.


Mb͕e ọ nāla na Ziklag, ndia sitere na Manase danyere ya, bú Adna, na Jozabad, na Jediael, na Maikael, na Jozabad, na Elaihu, na Ziletai, bú ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri ndi diri Manase.


Site kwa n'umu Isaka, bú ndi mara nghọta bayere mb͕e ahu nile, imara ihe Israel gēme; ndi-isi-ha bu ọgu iri; umu-nne-ha nile nēme kwa dika okwu-ọnu-ha si di.


Ọzọ kwa, ndi bi ha nso, rue Isaka na Zebulun na Naftali, nēweta achicha n'elu inyinya-ibu na n'elu camel, na n'elu inyinya mule, na n'elu ehi, ihe-oriri nke utu ọka, na mbadamba fig, na uyọkọ nkpuru-vine amiri ami, na manya-vine, na manu, na ìgwè ehi, na ìgwè ewu na aturu n'uba: n'ihi na ọṅù di n'Israel.


Devid we si nkpọkọta nile nke Israel, Ọ buru na ọ di unu nma, ọ buru kwa na o sitere na Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi zisara umu-nne-ayi ozi n'ebe nile, bú ndi fọduru n'ala nile nke Israel, ha na ndi-nchu-àjà na ndi Livai ndi bi n'obodo ebe-ita-nri nile ha, ka ha we chikọta onwe-ha n'ebe ayi nọ:


Solomon we gwa Israel nile okwu, bú ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na nke usu nile nke ọgu ndikom ise, na ndi-ikpe, na onye-isi ọ bula nke Israel nile, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna.


Hezekaia, bú eze, we bilie n'isi-ututu, chikọta ndi-isi obodo, rigorue ulo Jehova.


Nmebi èchìchè nile di mb͕e ìzù nzuzo nādigh: Ma n'ọtutu ndi nādu ọdu ka ha nēguzosi ike.


Ngwa ngwa onye nara talent ise ahu gara were ha zua ahia, we rita urù talent ise ọzọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan