Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 12:40 - Bible Nso

40 Ọzọ kwa, ndi bi ha nso, rue Isaka na Zebulun na Naftali, nēweta achicha n'elu inyinya-ibu na n'elu camel, na n'elu inyinya mule, na n'elu ehi, ihe-oriri nke utu ọka, na mbadamba fig, na uyọkọ nkpuru-vine amiri ami, na manya-vine, na manu, na ìgwè ehi, na ìgwè ewu na aturu n'uba: n'ihi na ọṅù di n'Israel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

40 Ndị Isaka, na Zebụlọn, na Naftalị si ebe dị anya bute nri. Ịnyịnya ibu, na ịnyịnya kamel, na ịnyịnya muul na ehi ka ha ji bute nri ndị a. Ọ bụkwa nri dị iche iche ka ha butere, dịka ụtụ ọka, na achịcha e ji mkpụrụ fiig mee, na achịcha ndị ọzọ dị iche, na mmanya, na mmanụ, na igwe ehi, na igwe atụrụ. Ha si otu a bute nri ndị a nʼihi na oke ọṅụ jupụtara nʼala Izrel niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 12:40
14 Iomraidhean Croise  

Devid we gabiga elu nrigo nke-ntà, ma, le, Ziba, onye nējere Mefiboshet ozi, zutere ya, chiri inyinya-ibu abua ejikwara ejikwa, ọgu ob͕e achicha iri di kwa n'elu ha, na ọgu uyọkọ nkpuru-vine amiri ami ise, na ọgu nkpuru mb͕e okpom-ọku ise, na otù karama-akpukpọ manya-vine.


Ndi Israel nile we so ya n'azu rigo, ndi Israel nēb͕u kwa ọ̀jà, nāṅuri kwa oké ọṅù, ala we b͕awa n'olu-ha.


Ndi nile nke ala ahu we ṅuria ọṅu, obodo ahu di-kwa-ra jū: ha we were mma-agha me ka Atalaia nwua n'ulo eze.


Ha na Devid we nọ n'ebe ahu ubọchi atọ nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu: n'ihi na umu-nne-ha doziri ha ihe.


Devid we me ka ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na usu nile nke ọgu ndikom ise dua ya ọdu, bú onye-ndú ọ bula.


ha we were ọṅù uku rie ihe ṅu kwa ihe-ọṅuṅu n'iru Jehova ubọchi ahu. Ha we me Solomon nwa Devid eze nke ub͕ò abua, te ya manu nye Jehova ibu onye-ndú, ha te-kwa-ra Zedok manu ibu onye-nchu-aja.


N'ọdi-nma nke ndi ezi omume obi ndi obodo-ha nātọ ha utọ: Ọzọ, mb͕e ndi nēmebi iwu nāla n'iyì, iti-nkpu-ọṅù di.


Mb͕e ndi ezi omume nāba uba kari, ndi ala-ha nāṅuri: Ma mb͕e onye nēmebi iwu nāchi achi, ndi ala-ya nēze ume.


Jehova we sim, Je kwa, hu nwanyi n'anya nke iko huworo ya n'anya, nke bu kwa nwanyi aluru na nwunye nākwa iko, dika Jehova si ahu umu Israel n'anya, ọ bu ezie na ha onwe-ha nēche iru na chi ọzọ di iche iche, nāhu kwa mbadamba nkpuru-vine amiri ami n'anya.


Abigail we me ngwa, chiri ọgu ob͕e achicha iri, na karama-akpukpọ abua nke manya-vine juru nime ha, na aturu ise edoziri edozi, na mb͕é ọka aṅara aṅa ise, na ọgu uyọkọ nkpuru-vine amiri ami ise, na ọgu mbadamba fig iri, we bo ha inyinya-ibu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan