1 Ihe E Mere 12:39 - Bible Nso39 Ha na Devid we nọ n'ebe ahu ubọchi atọ nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu: n'ihi na umu-nne-ha doziri ha ihe. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a39 Mgbe ha pụkwutere Devid, ha so ya rie, ṅụọ, abalị atọ. Ọ bụkwa ihe ndị ezinaụlọ ha kwadoro ha ji bịa ka ha riri. Faic an caibideil |
Ọzọ kwa, ndi bi ha nso, rue Isaka na Zebulun na Naftali, nēweta achicha n'elu inyinya-ibu na n'elu camel, na n'elu inyinya mule, na n'elu ehi, ihe-oriri nke utu ọka, na mbadamba fig, na uyọkọ nkpuru-vine amiri ami, na manya-vine, na manu, na ìgwè ehi, na ìgwè ewu na aturu n'uba: n'ihi na ọṅù di n'Israel.