Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 12:20 - Bible Nso

20 Mb͕e ọ nāla na Ziklag, ndia sitere na Manase danyere ya, bú Adna, na Jozabad, na Jediael, na Maikael, na Jozabad, na Elaihu, na Ziletai, bú ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri ndi diri Manase.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Mgbe Devid gara Ziklag, ndị a bụ ndị ikom si nʼebo Manase ndị gbasooro ya: Adna, Jozabad, Jediael, Maikel, Jozabad, Elihu na Ziletai. Ndị a niile bụ ndịisi agha na-achị puku ndị agha nʼebo Manase.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 12:20
9 Iomraidhean Croise  

Ufọdu nime Manase dinyekwara Devid, mb͕e o soro ndi Filistia bia imegide Sọl n'agha, ma ha eyeghi ha aka: n'ihi na ndi-isi ndi Filistia were idu-ọdu zilaga ya, si, Ọ gēwere isi-ayi danyere onye-nwe-ya, bú Sọl.


Ndi ahu ye-kwa-ra Devid aka imegide usu ndi nāpunara madu ihe: n'ihi na ndi-dike bu dìnkpà ka ha nile bu, ha we buru ndi-isi n'usu-ndi-agha.


na Elienai, na Ziletai, na Eliel;


Gi onwe-gi gēsi kwa na ndi nka nile leputa ndi-dìnkpà, ndi nātu egwu Chineke, ndi nēkwu ezi-okwu, ndi nākpọ urù nēzighi ezi asì; i gēdo kwa ndi ahu n'isi ha, ibu ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi iri iri:


M'we chiri ndi-isi ebo nile unu, ndikom mara ihe, ndi ama-kwa-ra aha-ha, m'we do ha ndi-isi-unu, ndi-isi nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, na ndi-isi ọgu ise ọgu ise, na ndi-isi ọgu abua na iri ọgu abua na iri, na ndi-isi madu iri madu iri, na ndi-odozi-okwu, dika ebo nile unu si di.


Nwa ehi-ya buru uzọ mu, ima-nma diri ya; Mpi nke atu ka mpi-ya abua bu kwa: Ọ gēwere ha sọkọta ndi nile, rue nsọtu nile nke uwa: Ndi ahu bu kwa usu nile nke orú nnù ndikom na nnù ise nke Efraim, Ndi ahu bu kwa usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Manase.


Devid we bilie n'isi-ututu, ya onwe-ya na ndikom-ya, ila n'ututu, ilaghachi n'ala ndi Filistia. Ndi Filistia we rigo rue Jezreel.


Ndi-isi Filistia we si, Ndi-Hibru ndia, hà bu gini? Ekish we si ndi-isi ndi Filistia, Nkà abughi Devid, bú orù Sọl eze Israel, onye mu na ya nọworo ubọchi ndia ma-ọbu arọ ndia, ma ahutaghm n'aru ya ihe ọ bula di njọ site n'ubọchi ọ dapuru n'aka Sọl rue ta?


Ma ndi-isi ndi Filistia were iwe megide ya; ndi-isi ndi Filistia we si ya, Me ka nwoke a laghachi, ka o we laghachi n'ọnọdu-ya ebe i mere ka ọ buru onye-nlekọta-ya, ma ka ọ ghara iso ayi rida n'agha, ka o we ghara ighọrọ ayi onye-nmegide n'agha ahu: n'ihi na onye a gēji gini me ka ihe-ya tọ onye-nwe-ya utọ? ọ̀ gaghi-eji isi ndikom ndia?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan