Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 11:6 - Bible Nso

6 Devid we si, Onye ọ bula nke buru uzọ tib͕u ndi Jebus gābu onye-isi na ọchi-agha. Joab nwa Zeruaia we buru uzọ rigo, o we buru onye-isi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Devid ekwuolarị sị, “Onye ọbụla buru ụzọ buo agha megide ndị Jebus ga-abụ onyeisi ọchịagha ndị agha.” Joab nwa Zeruaya bụ onye mbụ gara, nʼihi ya, o nwetara ike ịbụ ọchịagha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 11:6
13 Iomraidhean Croise  

Joab nwa Zeruaia, na ndi-orù Devid, we pua, zute ha n'otù n'akuku ọdọ-miri Gibeon; ha we nọdu, ndi Devid n'otu akuku ọdọ-miri, na ndi Ish-boshet n'akuku nke-ọzọ nke ọdọ-miri.


Umu-ndikom Zeruaia atọ nọ kwa n'ebe ahu, bú Joab, na Abishai, na Asahel: ma ukwu Asahel di nfe n'ib͕a ọsọ dika otù nime mb͕ada nke di n'ọhia.


Ma Joab bu onye-isi usu-ndi-agha nile nke Israel: Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi ndi Keret, bu kwa onye-isi ndi Pelet:


Abnea we laghachi rue Hebron, Joab we wezuga ya n'etiti ọnu-uzọ-ama ikpayere ya uka na nwayọ, o we tie ya n'okpuru ọgiriga-ya nke-ise n'ebe ahu, o we nwua n'ihi ọbara Asahel, bú nwa-nne-ya.


Joab nwa Zeruaia bu onye-isi usu-ndi-agha; Jehoshafat nwa Ahailud bu onye-ncheta:


Okwu-ya we di n'ebe Joab nwa Zeruaia nọ, na n'ebe Abaiata onye-nchu-àjà nọ: ha we so Adonaija nēyere ya aka.


Ndi bi na Jebus we si Devid, I gaghi-abata n'ebe a. Devid we were ebe ewusiri ike nke Zaion; nke ahu bu obodo Devid.


Devid we biri n'ebe ahu ewusiri ike; n'ihi ya ka ha kpọrọ ya obodo Devid.


Joab nwa Zeruaia bu onye-isi usu-ndi-agha; Jehoshafat nwa Ahailud bu onye-ncheta.


ma nke nēso Ahitofel bu Jehoiada nwa Benaia, na Abaiata: onye-isi usu-ndi-agha eze bu Joab.


Ònye gēdubàm nke-ọma n'obodo ewusiri ike? Ònye duruworom rue Edom?


Ndikom Israel we si, Ùnu ahuwo nwoke a nke nārigota? n'ihi na ọ bu ita Israel uta ka ọ nārigota: ọ gēru kwa, na nwoke nke nētib͕u ya, eze gēwere àkù uku me ka ọ buru ọgaranya, ọ gēnye kwa ya nwa-ya nwayi, me ka ulo nna-ya nwere onwe-ya n'Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan