Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 11:3 - Bible Nso

3 Ndi-okenye nile nke Israel we biakute eze rue Hebron; ha na Devid we b͕a ndu nime Hebron n'iru Jehova; ha we te Devid manu ibu eze Israel, dika okwu Jehova n'aka Samuel si di.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Mgbe ndị okenye Izrel niile bịakwutere eze Devid na Hebrọn, ya na ha gbara ndụ nʼihu Onyenwe anyị na Hebrọn. Ha tere ya mmanụ ịbụ eze Izrel, dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa site nʼọnụ Samuel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 11:3
15 Iomraidhean Croise  

Ndikom Juda we bia te Devid manu n'ebe ahu ibu eze ulo Juda. Ha we gosi Devid, si, Ndikom Jebesh-gilead bu ndi lìri Sọl.


Ndi-okenye nile nke Israel we biakute eze rue Hebron; ha na eze, bú Devid, we b͕a ndu nime Hebron n'iru Jehova: ha we te Devid manu ibu eze Israel.


Na Hebron ka ọ bu eze Juda arọ asa na ọnwa isi: na Jerusalem ka ọ bu kwa eze Israel na Juda nile orú arọ na iri na atọ.


Jehoiada we me ọb͕ub͕a-ndu nke di n'etiti Jehova na eze na ndi Juda, na ha gābu ndi Jehova nwere; na n'etiti eze na ndi Juda.


Ndi-orù-ya we si na Megido buru ya nime ub͕ọ-ala mb͕e ọ nwuru anwu, ha we bubata ya na Jerusalem, lìe ya n'ílì-ya. Ndi ala ahu we kuru Jehoahaz nwa Josaia, te ya manu, me ya eze n'ọnọdu nna-ya.


Ma ndia bu ndi-isi nke ndi-dike Devid nwere, ndi mere onwe-ha ka ha di ike n'akuku ya n'ala-eze-ya, ha na Israel nile, ime ya eze, dika okwu Jehova si di bayere Israel.


Nkpọkọta ahu nile na eze we b͕a ndu n'ulo Chineke. Ọ si ha, Le, nwa eze gābu eze, dika Jehova kwuworo bayere umu Devid.


Jefta we jeso ndi-okenye Gilead, ndi ahu we mee ya onye-isi na onye-ọchi-agha ichi ha: Jefta we kwue okwu-ya nile n'iru Jehova nime Mizpa.


Ndi Israel nile we jerue Gilgal; ha we me Sọl eze n'ebe ahu n'iru Jehova nime Gilgal; ha we chua ihe àjà nke àjà-udo n'iru Jehova n'ebe ahu. Sọl na ndikom nile nke Israel we ṅuria ọṅu nke-uku n'ebe ahu.


Samuel we si ya, Jehova adọwapuwo ala-eze Israel n'aru gi ta, nye ya madu-ibe-gi, nke di nma kari gi.


Jehova we si Samuel, Rùe ole mb͕e ka gi onwe-gi ganēruru Sọl újú, ebe Mu onwem juworo ya ka ọ ghara ibu eze Israel? b͕ajue manu na mpi-gi, je, M'gēziga gi jekuru Jesi onye Bet-lehem: n'ihi na ahutaworom onwem eze n'etiti umu-ya ndikom.


I gākpọ kwa Jesi ibia n'ichu-aja ahu, Mu onwem gēme kwa ka i mara ihe i gēme: i gēte-kwa-ram ya manu, bú onye M'gāsi gi te.


Ha abua we b͕a ndu n'iru Jehova: Devid we nọdu n'oké ọhia, ma Jonatan lara n'ulo-ya.


Ma Jehova emeworo Onwe-ya, dika O kwuru site n'akam: Jehova adọwapuwo kwa ala-eze n'aka-gi, nye ya madu-ibe-gi, bú Devid.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan