Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ihe E Mere 11:20 - Bible Nso

20 Ma Abishai, bú nwa-nne Joab, onye ahu bu onye-isi ndikom atọ ahu: onye ahu feghari-kwa-ra ube-ya imegide ọgu ndikom iri-na-ise, ha we ghọ ndi eb͕uru eb͕u, o we nwe aha n'etiti ndikom atọ ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Abishai, nwanne Joab bụ onyeisi ndị ikom atọ ahụ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, tigbukwaa ha niile. Nʼihi nke a, ọ ghọrọ onye a ma ama dịka mmadụ atọ ndị a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ihe E Mere 11:20
10 Iomraidhean Croise  

Devid we zipu ndi ahu, otù uzọ n'uzọ atọ n'aka Joab, na otù uzọ n'uzọ atọ n'aka Abishai nwa Zeruaia, nwa-nne Joab, na otù uzọ n'uzọ atọ n'aka Itai, bú onye Gat Eze we si ndi-ya, Aghaghm iso unu pua, ọbuná mu onwem.


Umu-ndikom Zeruaia atọ nọ kwa n'ebe ahu, bú Joab, na Abishai, na Asahel: ma ukwu Asahel di nfe n'ib͕a ọsọ dika otù nime mb͕ada nke di n'ọhia.


Devid we si Abishai, Ub͕u a Sheba nwa Bikri gēmejọ ayi kari Absalom: gi onwe-gi chiri ndi-orù onye-mwe-gi, chua ya n'azu, ka o we ghara ichọtara onwe-ya obodo ufọdu ewusiri ike, we naputa onwe-ya n'anya-ayi.


Ma Abishai nwa Zeruaia yere ya aka, tib͕ue onye Filistia ahu, me ka ọ nwua. Mb͕e ahu ndikom Devid ṅuru ya iyi, si, I gaghi eso ayi pua ibu agha ọzọ, ka i ghara imenyu oriọna Israel.


Ma Joab na Abishai, bú nwa-nne-ya, b͕uru Abnea, n'ihi na o mere ka nwa-nne-ha, bú Asahel, nwua nime Gibeon n'agha ahu.


si, Ya burum ihe-árú sitere na Chinekem, ime ihe a: #m'gāṅu ọbara ndikom ahu ndi ji ndu-ha n'aka-ha je? n'ihi na ha ji ndu-ha n'aka-ha kute ya. O kweghi kwa iṅu ya. Ihe ndia ka ndi-dike atọ ahu mere.


N'etiti ndikom atọ ahu anāsọpuru ya kari abua fọduru, o we ghọrọ ha onye-isi: ma o rughi ndikom atọ mbu ahu.


Umu-nne-ha ndinyom bu Zeruaia na Abigail. Umu-ndikom Zeruaia kwa; Abishai, na Joab, na Asahel, atọ.


Devid we za, si Ahimelek, bú onye Het, si kwa Abishai nwa Zeruaia, bú nwa-nne Joab, si, Ònye gēsorom ridakuru Sọl, rue ọmuma-ulo-ikwū? Abishai we si, Mu onwem gēsoro gi rida.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan