1 Ihe E Mere 11:10 - Bible Nso10 Ma ndia bu ndi-isi nke ndi-dike Devid nwere, ndi mere onwe-ha ka ha di ike n'akuku ya n'ala-eze-ya, ha na Israel nile, ime ya eze, dika okwu Jehova si di bayere Israel. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a10 Ndị a bụ ndịisi ndị dike nʼetiti ndị agha Devid. Ha na ndị Izrel niile nyere ịchị eze Devid ezi nkwado ime ka ọchịchị ya ruo nʼakụkụ niile nke ala ahụ, dịka Onyenwe anyị kwere na nkwa. Faic an caibideil |
Ma umu Israel, dika ọnu-ọgugu-ha si di, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha na ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na usu nile nke ọgu ndikom ise, na ndi-odozi-okwu-ha ndi nējere eze ozi, n'ihe ọ bula nke òkè nile ndi nābata nāpu kwa n'ọnwa n'ọnwa, n'ọnwa nile nke arọ, otù òkè di orú nnù uzọ atọ.
Devid we kpọkọta ndi-isi nile nke Israel, bú ndi-isi ebo nile, na ndi-isi òkè nile ndi nējere eze ozi, na ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndi-isi usu nile nke ọgu ndikom ise, na ndi-isi àkù na anu-ulo nile eze nwere, na nke umu-ya ndikom nwere, ha na ndi-onozi, na ndi-dike, ọbuná dike ọ bula nke bu dìnkpà, rue Jerusalem.