Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Mkpughe 4:3 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ụdịdị onye nọkwasịrị nʼocheeze ahụ na-egbu nweghenweghe dịka nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ jaspa na kanelian. Eke na egwurugwu dịka nkume oke ọnụahịa. Emeralụdụ gbara ocheeze ahụ gburugburu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

3 Onye ahu Nke nānọdu ala yiri nkume jasper na sardius ma ọ buru na anēle Ya anya: eke-na-ogwurugwu di kwa oche-eze ahu gburugburu, yiri emerald ma ọ buru na anēle ya anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Mkpughe 4:3
13 Iomraidhean Croise  

Ha hụrụ Chineke nke Izrel. Nʼokpuru ụkwụ ya abụọ, e were ihe dịka ebe nzọkwasị ụkwụ nke e ji nkume safaia mee. Nkume ndị a na-enwukwa ezi onwunwu dịka mbara eluigwe.


nʼahịrị nke abụọ, ga-abụ nkume tọkwọisi, safaia na emeralụdụ.


nʼahịrị nke abụọ bụ: nkume tọkwọisi, safaia na emeralụdụ.


Nʼafọ ahụ, mgbe eze bụ Ụzaya nwụrụ, ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ nọ nʼocheeze ya dị oke elu. Ọnụ ọnụ ala uwe ya jupụtara ụlọnsọ ukwuu ya.


Nʼelu mbara eluigwe ahụ, o nwere ihe dịka ocheeze e ji nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ safaia wuo. Otu onye, nke ụdịdị ya dị ka nwoke, nọkwasịkwara nʼelu oche ahụ.


Ìhè ahụ gbara ya gburugburu, nke a na-ahụ anya, dịkwa ka ìhè eke na egwurugwu, nke a na-ahụ anya nʼoge mmiri na-ezo. Otu a ka ebube Onyenwe anyị si gosi m onwe ya. Mgbe m hụrụ ya, adara m nʼala kpuo ihu m nʼala. Mgbe ahụ, anụrụ m olu onye na-ekwu okwu.


Mgbe ahụ, elere m anya hụ ocheeze ọma e ji nkume safaia wuo ka ọ pụtara ihe na mbara eluigwe, nʼelu ebe ahụ isi cherubim ndị ahụ dị.


Ị nọ nʼIden, nʼubi Chineke a gbara ogige. Nʼebe ahụ ka e ji nkume dị oke ọnụahịa ndị a chọọ gị mma, rubi, na topaazi, na emeralụdụ, na krisolaịt, na ọniks, na jaspa, na safaia, na tọkwọisi, na beril. A rụnyere nkume ndị a niile nʼime ọlaedo. Ọ bụkwa nʼụbọchị ahụ e kere gị ka e doziri ha.


Ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ dị oke egwu ka o si nʼeluigwe na-arịdata. Igwe ojii gbara ya gburugburu. Eke na egwurugwu dịkwa ya nʼisi. Ihu ya na-egbukwa maramara dịka anyanwụ. Ụkwụ ya na-acha dịka ogidi na-enwu ọkụ.


O jupụtara nʼebube Chineke, na-enwu ma na-achakwa dịka nkume dịkarịsịrị oke ọnụahịa, dịka nkume jaspa, na-enwu dịka kristal.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan