Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 9:5 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ndị ahụ yikwasịrị nʼụkwụ ha akpụkpọụkwụ kara nka nke a kwachiri akwachi, na uwe mere nnọọ ochie. Achịcha niile ha ji bụ nri ha, kpọrọ nkụ maakwa ebu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

5 akpukpọ-ukwu kara nká, nke ab͕ara ab͕a, di kwa n'ukwu-ha, uwe kara nká di kwa n'aru ha; achicha nile nke ihe ha nēri n'uzọ kpọ-kwa-ra nku, ma kwa ebu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 9:5
7 Iomraidhean Croise  

“Ma nna ya gwara ndị ohu ya sị, ‘Meenụ ngwangwa weta uwe kachasị mma yikwasị ya. Gbanye ya ọlaaka nʼaka, yinyekwanụ ya akpụkpọụkwụ nʼụkwụ.


Ma Onyenwe anyị na-asị, “Nʼime iri afọ anọ ndị ahụ nke m duuru unu nʼime ọzara, uwe unu emeghị ochie, akpụkpọụkwụ unu akapụghị nʼụkwụ unu.


Ihe mkpọchi nke ọnụ ụzọ ama gị ga-abụ bronz na igwe, dịka ụbọchị ndụ gị niile si dị, otu a ka ịdị ike gị ga-adị.


Lee achịcha ndị a bụ nke anyị ji mgbe anyị hapụrụ ala anyị. Ha dị ọkụ mgbe anyị hapụrụ ụlọ anyị ịbịa njem a, nʼihi na e si nʼebe a na-eghe ya wepụta ya, ma ugbu a, dịka unu hụrụ, ha akpọọla nkụ, bidokwa ịma ebu.


A gbajuru karama akpụkpọ anyị ndị a mmanya ọhụrụ mgbe anyị hapụrụ, ma ugbu a, karama ndị a adọwaala. Uwe anyị, na akpụkpọụkwụ anyị, emeela ochie nʼihi ịga ije dị anya.”


ha sitere nʼaghụghọ chọọ ụzọ ha ga-esi zọpụta onwe ha. Ha zipụrụ ndị ozi, ndị bokwasịrị ịnyịnya ibu ha akpa mere ochie, na karama akpụkpọ mere ochie, nke a duchiri ebe dị iche iche nʼahụ ha.


Mgbe ha bịaruru nʼebe ndị Izrel mara ụlọ ikwu ha na Gilgal, ha jekwuuru Joshua, gwa ya na ndị Izrel okwu sị ha, “Anyị si nʼala dị anya bịa. Ugbu a, biko anyị chọrọ ka anyị na unu gbaa ndụ.”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan