Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 9:1 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Mgbe eze ndị niile bi nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan, nụrụ banyere ihe ndị a, ya bụ, ndị niile bi nʼala ugwu ugwu nʼọdịda anyanwụ ndagwurugwu, na ndị bi ogologo akụkụ osimiri Mediterenịa ruo Lebanọn, eze ndị Het na nke ndị Amọrait na nke ndị Kenan na nke ndị Periz na nke ndị Hiv na nke ndị Jebus,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

1 O rue, mb͕e eze nile ndi bi n'ofè Jọdan, n'ugwu, na n'ebe di ala ala, na n'ọnu-miri nile nke oké osimiri uku ahu na ncherita-iru Lebanon, ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, nuru ya;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 9:1
32 Iomraidhean Croise  

Ha jere ruokwa nʼebe e wusiri ike nke Taịa, na obodo niile nke ndị Hiv, na nke ndị Kenan. Nʼikpeazụ, ha gaara ruo Bịasheba nʼime ndịda Juda.


Mmụọ ozi m ga-ejekwa nʼihu unu, ịkpọbatakwa unu nʼala ndị Amọrait, na ndị Het, na ndị Periz, na ndị Kenan, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Aga m ehichapụ obodo ndị a niile.


“Aga m etinye oke ala unu site nʼOsimiri Uhie ruo nʼosimiri Mediterenịa, sitekwa nʼọzara ruo nʼosimiri Yufretis. Aga m enyefe ndị niile bi nʼala ahụ nʼaka unu. Unu ga-achụpụkwa ha.


Ekweela m nkwa ịkpọpụta unu site nʼahụhụ unu na-ahụ nʼala Ijipt duru unu baa nʼala nke ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Hiv, na ndị Jebus bi nʼime ya. Ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.’


Debe ihe niile m nyere gị nʼiwu taa. Aga m esite nʼihu unu chụpụ ndị Amọrait, ndị Kenan, ndị Het, ndị Periz, ndị Hiv na ndị Jebus.


Ndị Amalek bi na Negev, ndị Het na ndị Jebus na ndị Amọrait bi nʼala ugwu ugwu. Ma nʼakụkụ osimiri Mediterenịan na ndagwurugwu mmiri Jọdan ka ndị Kenan bi.”


Oke ala unu nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ga-abụ ọnụ mmiri osimiri Mediterenịa. Nke a ga-abụ oke ala unu.


Ugbu a bilienụ ije, baa nʼala ugwu ugwu ndị Amọrait. Gaakwanụ nʼala niile ndị agbataobi ha bụ Araba, nʼugwu niile na nʼebe dị ala ala na Negeb, nʼọnụ mmiri nke oke osimiri, garuokwanụ ala ndị Kenan na nke ndị Lebanọn, gagidekwanụ ruo nʼosimiri ukwu Yufretis.


Kwere ka m gafee hụ ala ọma ahụ dị nʼofe ọzọ nke Jọdan, ala ugwu ugwu ahụ mara mma, na Lebanọn.”


ruo nʼala Araba niile, nke dị nʼọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, ruokwa nʼOsimiri Nnu, nʼala ala ugwu Pisga.


Mgbe Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-akpọbata unu nʼala ahụ unu na-abanye inweta, mgbe o si nʼihu unu chụpụ ọtụtụ mba ndị a nʼihu unu, bụ ndị Het, ndị Gigash, ndị Amọrait, ndị Kenan, ndị Periz, ndị Hiv na ndị Jebus, bụ mba asaa ndị dị ike nke ukwuu, baakwa ụba karịa unu;


tutu ruo mgbe Onyenwe anyị Chineke unu nyere ha izuike, dịka o si nye unu, na tutu ruo mgbe ha nwetara ala niile bụ nke Onyenwe anyị Chineke unu ga-enye ha. Mgbe nke a mezuru, unu ga-alaghachi azụ, nweta ala ahụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan.”


Oke ala unu ga-abụ site nʼọzara dị na ndịda ruo Lebanọn, ma site nʼiyi ukwu Yufretis, tinyere ala niile nke ndị Het, ruo nʼosimiri ukwu ahụ dị nʼọdịda anyanwụ.


Ya mere, ha kpọpụtara ndị eze ise ahụ site nʼọgba nkume ahụ, ha bụ eze Jerusalem, na eze Hebrọn, na eze Jamut, na eze Lakish, na eze Eglọn.


Nʼihi nke a, ala ndị Izrel nwere gbasara nʼụzọ niile site nʼugwu Halak, nke dị nso na Sia, ruo Baal-Gad nke dị na Ndagwurugwu Lebanọn, na ndịda ugwu Hemon. Joshua jidere ma gbukwaa ndị eze ndị ala ahụ niile.


na ala ndị Gebal niile; na Lebanọn niile ruo nʼọwụwa anyanwụ, site Baal-Gad nʼokpuru ugwu Hemon ruo na mbata Hamat.


Oke ala ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ bụ ọnụ mmiri osimiri Mediterenịa. Ndị a bụ oke ala gbara ndị Juda gburugburu dịka ikwu ha niile si dị.


Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke unu enyela ụmụnna unu mmeri. O meekwala ka ha zuru ike dịka o kwere nkwa na ọ ga-eme. Ugbu a, laghachinụ nʼụlọ unu, laghachikwanụ nʼala unu, ala ahụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan.


Ọkara ebo Manase ka Mosis nyere ihe nketa nke ha nʼime ala Bashan, ma ọkara ebo Manase nke ọzọ nwetara ihe nketa nke ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan. Mgbe Joshua na-ezilaga ha nʼụlọ ha, ọ gọziri ha, gwa ha okwu sị,


Unu hụrụ na ekekwarala m unu ala mba ahụ niile nke fọdụrụnụ ka ha bụrụ ihe nketa ebo unu, site na Jọdan, tinyekwara mba niile ndị ahụ m kpochapụrụ nʼakụkụ osimiri Mediterenịa dị na mpaghara ọdịda anyanwụ.


“ ‘Emesịa, unu gafere osimiri Jọdan bịaruo Jeriko. Ndị ikom Jeriko busoro unu agha, otu a kwa ka ndị Amọrait, na ndị Periz, na ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Gigash, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Ma eweere m ha niile nyefee unu nʼaka.


Otu a ka unu ga-esi mata nʼezie na Chineke dị ndụ nọ nʼetiti unu, unu ga-amatakwa na ọ ghaghị ịnapụ ndị Kenan, na ndị Het, na ndị Hiv, na ndị Periz, na ndị Gigash, na ndị Amọrait, na ndị Jebus ala ha nʼihu unu.


Ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị guzoro nʼala akọrọ nʼetiti Jọdan, Izrel niile gabigakwara tutu ruo mgbe mba ahụ niile gafesịrị nʼala akọrọ.


Mgbe ndị eze ndị Amọrait niile, ndị bi nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, na ndị eze ndị Kenan niile bi nʼakụkụ oke osimiri Mediterenịa, nụrụ na Onyenwe anyị emeela ka osimiri Jọdan takpọọ nʼihu ụmụ Izrel, ruo mgbe anyị niile gafesịrị, obi lọrọ ha mmiri. Ọ dịkwaghị ike ọbụla fọdụụrụ ha iguzo nʼihu ụmụ Izrel.


Ya mere, Onyenwe anyị nọnyeere Joshua. Akụkọ a kọrọ banyere ya gbasara nke ukwuu nʼala ahụ niile.


Ndị ikom Izrel zaghachiri sị ndị Hiv ahụ, “Olee otu anyị si amata na unu ebighị anyị nso? Ma eleghị anya unu bi anyị nso, anyị na unu ọ ga-esi aṅaa gbaa ndụ?”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan