Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 7:9 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Nʼihi na mgbe ndị Kenan na ndị bi nʼakụkụ ala ahụ ga-anụ maka mmeri e meriri anyị, ha ga-agba anyị gburugburu lụso anyị agha, bipụ aha anyị nʼụwa. Ọ bụkwa gịnị ka ị ga-eme banyere aha ukwu gị dị ebube?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

9 Ndi Kenean na ndi nile bi n'ala nka gānu kwa ya, we b͕a ayi buruburu, bipu aha-ayi n'uwa: ọ̀ bu kwa gini ka I gēmere aha uku Gi?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 7:9
19 Iomraidhean Croise  

Ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, o Onyenwe anyị, ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, kama ọ bụ aha gị ka ebube na-adịrị, nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị.


O Chineke, dịka aha gị, otuto gị na-eru na nsọtụ ụwa niile; aka nri gị jupụtara nʼezi omume.


Nyere anyị aka, O Chineke, Onye Nzọpụta anyị, nʼihi ebube nke aha gị; napụta anyị, gbaghara mmehie anyị niile nʼihi aha gị.


Ha na-asị, “Bịanụ ka anyị laa mba a nʼiyi, ka a ghara ichetakwa aha Izrel ọzọ.”


Ha ji otu obi na-agbarịta izu; ha agbaala ndụ imegide gị,


Nʼihi gịnị ka ndị Ijipt ga-ekwu sị, ‘Ọ bụghị ime ha ihe ọjọọ ka o ji dupụta ha, ka o nwee ike gbuo ha nʼugwu ndị a, ma kpochapụkwa ha site nʼelu ụwa a?’ Site nʼiwe gị dị ọkụ chigharịa, kwere ka ọ dajụọ. Chigharịakwaa site nʼatụmatụ ọjọọ a nʼebe ndị gị nọ.


Ma nʼihi aha m, e si m Ijipt kpọpụta ha. E mere m nke a ka a ghara imerụ aha m bụ nke dị nsọ, nʼanya ndị mba dị iche iche nʼetiti ndị ha binyere, bụ ndị mkpughere onwe m nye Izrel nʼihu ha.


Ka ndị nchụaja, bụ ndị na-ejere Onyenwe anyị ozi, nọọ nʼetiti ebe ịchụ aja, na mpụta ọnụ ụlọ kwaa akwa. Ha kpeekwa ekpere sị, “Zọpụta ndị gị, Onyenwe anyị. Ekwela ka ihe nketa gị bụrụ ihe ịta ụta, nʼetiti mba dị iche iche. Ekwela ka ha sị, ‘Olee ebe Chineke ha nọ?’ ”


Mgbe ahụ, ndị iro m ga-ahụ, ihere ga-ekpuchi onye ahụ sịrị m, “Olee ebe Onyenwe anyị Chineke gị ahụ nọ.” Aga m eji anya m hụ mgbe ọ ga-ada, ọ bụladị dịka e si na-azọ ya ụkwụ, dịka apịtị dị nʼokporoụzọ.


Ma Mosis rịọrọ Onyenwe anyị sị ya, “Gịnị ka ndị Ijipt ga-eche banyere nke a, mgbe ha ga-anụ ya? Ha maara nke ọma otu ị sịrị jiri ike gị napụta ndị a site nʼetiti ha.


Nna, nye aha gị otuto.” Mgbe ahụ, otu olu siri nʼeluigwe bịa, “Enyela m ya otuto, m ga-enyekwa ya otuto ọzọ.”


Ma ọ bụghị otu a, ndị obodo ahụ nke i si na ya kpọpụta anyị ga-asị, ‘Ọ bụ nʼihi na Onyenwe anyị apụghị inye ha ala o kwere ha na nkwa ka o ji laa ha nʼiyi. Nʼihi na ọ kpọrọ ha asị, ka o ji kpọbata ha nʼime ọzara mee ka ha nwụọ nʼebe ahụ.’


Ma Onyenwe anyị sịrị Joshua, “Bilie ọtọ! Gịnị bụ nke a, na ị dara kpuo ihu nʼala?


Biko, Onyenwe m, Gịnị ka m ga-ekwu ugbu a ụmụ Izrel sitere nʼihu ndị iro ha gbaa ọsọ?


Onyenwe anyị agaghị ahapụ ndị ya ọ họpụtara, nʼihi na-ime ihe dị otu a bụ iwetara aha ya dị ukwuu ihere. Ọ tọrọ Onyenwe anyị ụtọ ime unu mba pụrụ iche nye onwe ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan