Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 7:21 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Mgbe m hụrụ nʼetiti ihe ndị a kwatara nʼagha, otu uwe mwụda Babilọn mara mma, na narị Shekel ọlaọcha abụọ, na mkpirisi ọlaedo ịdị arọ ya ruru iri shekel ise. E nwere m anya ukwu nʼebe ihe ndị a dị, chịrị ha. Lee, ezoro m ha nʼime ala nʼụlọ ikwu m, ọlaọcha ahụ dịkwa nʼokpuru ya.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

21 m'we hu n'etiti ihe-nkwata otù ezi uwe-nwuda nke Shaina, na ọgu shekel ọla-ọcha iri, na otù nkpirikpi ọla-edo nke ọtùtù-ya di ọgu shekel abua na iri, m'we nwe anya-uku n'ebe ha di, m'we chiri ha; ma, le, ezoworo ha n'ala n'etiti ulo-ikwūm, ọla-ọcha ahu di kwa n'okpuru ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 7:21
35 Iomraidhean Croise  

Obodo ndị bụ mmalite alaeze ya bụ, Babel, Erek, Akad na Kalne, ndị dị nʼala Shaịna.


Nwanyị ahụ hụrụ na mkpụrụ si nʼosisi ahụ dị mma iri eri, na ọ dị mma nʼanya, na ọ bụ osisi mara mma e si enweta amamihe. Ọ ghọọrọ mkpụrụ ahụ rie, nyekwa di ya, onye nke na ya nọ, o rie.


Mgbe ahụ ụmụ ndị ikom Jekọb niile bịakwasịrị ndị a e gburu egbu, kwakọọ ihe niile dị nʼobodo ahụ niile, nʼihi mmerụ e merụrụ nwanne ha nwanyị.


ka ụmụ ndị ikom Chineke bidoro ilekwasị ụmụ ndị inyom ndị mmadụ anya, hụ na ha mara mma. Ha duuru ndị inyom ọbụla masịrị ha ka ha bụrụ nwunye ha.


Nʼotu uhuruchi, Devid sitere nʼihe ndina ya bilie, gagharịa nʼelu ụlọeze ya. Ọ sitere nʼelu ụlọ ahụ hụ otu nwanyị na-asa ahụ. Nwanyị ahụ mara mma nke ukwu nʼile anya.


Mgbe ndị ekpenta ahụ rutere ogige ndị agha ndị Siria, ha banyere nʼime otu ụlọ rie ihe, ṅụkwaa ihe ọṅụṅụ dị nʼime ya. Ha chịịrị ọlaọcha na ọlaedo na uwe ọma niile dị nʼime ya gaa zoo ha. Ọzọkwa, ha lọghachiri banye nʼụlọ ọzọ kwakọrọ ụfọdụ ihe dị nʼime ya gaa zoo.


“Mụ na anya m gbara ndụ kpebie na o nweghị mgbe m ga-ele nwaagbọghọ ọbụla anya nʼihi agụụ ịkwa iko.


Wepụ anya m site nʼihe na-abaghị uru; chebe ndụ m dịka okwu gị si dị.


Gị enwela anya ukwu nʼebe ụlọ onye agbataobi gị dị. Gị enwekwala anya ukwu nʼebe nwunye onye agbataobi gị dị, maọbụ ohu ya nwoke maọbụ ohu ya nwanyị, ehi ya maọbụ ịnyịnya ibu ya, ma ọ bụkwanụ nʼihe ọbụla nke onye agbataobi gị nwere dị.”


Otu a ka ọ na-adịkwara ndị ọ na-agụsị agụụ ike inweta akụnụba nʼụzọ na-ezighị ezi. Nʼihi na ịgbaso ụzọ dị otu a na-ewetara ndị na-eso ya ọnwụ.


Elekwasịla mmanya anya mgbe ọ na-acha ọbara ọbara, mgbe ọ na-ezipụta ọdịdị ya nʼiko mgbe ọ na-asụgharị nke ọma nʼime iko.


Onye aka ntagide ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịghọ ọgaranya amaghị na ụkpa nọ na-eche ya.


Nke ka nke, lezie echiche uche gị niile anya, nʼihi na ha na-emetụta ndụ gị niile.


Nʼihi na unu ekwuola sị, “Anyị na ọnwụ agbaala ndụ, anyị na ala mmụọ enwekọọkwala otu mkpebi. Mgbe ịla nʼiyi ahụ dị ukwuu ga-esi nʼebe anyị nọ gafee, ọ gaghị erute anyị, nʼihi na anyị emeela ka okwu ụgha bụrụ ebe mgbaba anyị; ọ bụkwa nʼime okwu ụgha ka anyị na-ezo onwe anyị.”


Ahụhụ ga-adịrị ndị na-eche na ha na-ezonarị Onyenwe anyị nzube ha, ndị na-agbalịsị ike ime ihe ha zubere na nzuzo, ma na-asịrịta onwe ha, “Chineke agaghị ahụ anyị. Ọ maghị ihe anyị na-eme!”


“Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọ ya site nʼuru ọjọọ, nke na-ewukwasị akwụ ya nʼebe dị elu, nʼihi ịgbanarị mbibi nke ga-abịa.


Ma ọ sịrị ha, “Kpachapụnụ anya! Nọrọnụ na nche banyere oke ọchịchọ niile, nʼihi na ndụ mmadụ adabereghị nʼọtụtụ ihe o nwere.”


Nʼihi na ọ dịghị ihe ọbụla zoro ezo nke na-agaghị apụta ìhè, ọ dịkwaghị ihe e kpuchiri ekpuchi nke a na-agaghị ekpughe.


Ma nʼetiti unu, ka a ghara ịkpọta mmehie ịkwa iko, maọbụ nke adịghị ọcha, maọbụ nke inwe anya ukwu aha, nʼihi na ihe ndị a ekwesighị nʼetiti ndị nsọ.


Matanụ nke ọma na onye na-akwa iko, maọbụ onye rụrụ arụ, maọbụ onye anya ukwu, nʼihi na anya ukwu dị ka ikpere arụsị, enweghị ike ịbata nʼalaeze Kraịst na Chineke.


Kpọọnụ arụsị niile nke apịrị apị nke chi niile ha ọkụ. Unu enwela anya ukwu nʼebe ọlaọcha maọbụ ọlaedo dị ha nʼahụ dị. Unu ewerela ya ka ọ bụrụ nke unu, ka unu ghara ịbụ ndị ọ matara nʼọnya, nʼihi na ọ bụ ihe arụ nye Onyenwe anyị bụ Chineke unu.


Meenụ ka ọchịchọ ọjọọ niile nke ụwa dị nʼime unu bụrụ ihe nwụrụ anwụ. Unu etinyekwala aka nʼịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ime ihe ọjọọ, na anya ukwu (nke bụkwa ikpere arụsị).


Debenụ ndụ unu pụọ nʼịhụnanya nke ego, ka afọ ju unu nʼihe unu nwere, nʼihi na o kwuola, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbakụta gị azụ.”


Ọchịchọ ahụ, mgbe ha bara ụba nʼime obi, na-eduba mmadụ na mmehie. Mgbe mmehie bara ụba, ọ na-eduba nʼọnwụ.


Mgbe ahụ, Ekan zara Joshua sị ya, “Ọ bụ eziokwu! Emehiela m megide Onyenwe anyị, Chineke Izrel. Lee ihe m mere.


Ya mere, Joshua zigara ụfọdụ ndị ikom ka ha gaa chọọ ihe ahụ Ekan zoro. Ndị a gara nʼụlọ ikwu ahụ, chọpụta ihe ahụ ezuru nʼohi. Dịka Ekan kwuru, ihe ikpeazụ ha hụrụ bụ ọlaọcha ahụ.


Ha esitela nʼezi ụzọ ahụ jehie, soro omume Belam nwa Beoa, onye hụrụ ụgwọ ọrụ nke ajọ omume nʼanya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan