Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 7:2 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Emesịa, Joshua si Jeriko zipụ ụfọdụ ndị mmadụ ka ha gaa Ai, obodo dị Bet-Aven nso, nʼọwụwa anyanwụ Betel. Ọ gwara ha sị ha, “Gaanụ nnyopụta akụkụ ala ahụ niile.” Ya mere, ndị ahụ gara nnyochapụta obodo Ai.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

2 Joshua we si na Jeriko ziga ndikom ije Ai, nke di nso Bet-even, n'akuku Iru-anyanwu nke Bet-el, o we gwa ha okwu, si, Rigonu, ledo ala ahu. Ndikom ahu we rigo, ledo Ai.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 7:2
18 Iomraidhean Croise  

Emesịa, Ebram hapụrụ ebe ahụ chee ihu nʼala ugwu dị nʼọwụwa anyanwụ Betel, maa ụlọ ikwu ya. Obodo Betel dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ma obodo Ai dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ebe ọ mara ụlọ ikwu ya. Nʼebe nsọ ahụ Ebram wuru ebe ịchụ aja, nọrọ nʼebe ahụ kpọkuo aha Onyenwe anyị.


Ọ kpọrọ ebe ahụ Betel, ọ bụ ezie na Luz bụ aha obodo ahụ na mbụ.


Otu nʼime ha ka o guzobere na Betel, tinyekwa nke ọzọ na Dan.


Ndị agbụrụ Benjamin biri na Geba, Mikmash, Aija, Betel na obodo dị ya gburugburu,


Buru ụzọ nata ndụmọdụ tupu i mee ihe ọbụla ị chọrọ ime; ebula agha ma i bubeghị ụzọ pịa ọpịpịa.


Ejela ọgụ ma ọ bụghị na i nwetara ezi ndụmọdụ, nʼihi na nzọpụta dị nʼige ọtụtụ ndị ndụmọdụ ntị.


Ha erutela Ayịat; ugbu a, ha nọ na Migrọn. Ha na-edokọta ngwa agha ha na Mikmash.


“Kpọọ mkpu akwa, gị Heshbọn, nʼihi na ebibiela Ai! Tisienụ mkpu akwa ike unu ndị bi na Raba! Yirinụ uwe mkpe unu, tiekwanụ aka nʼobi nʼihi iru ụjụ; gbagharịanụ nʼogige mgbidi obodo unu, nʼihi na a ga-adọta Molek nʼagha, buru ya na ndị nchụaja ya na ndịisi ọchịchị ya gaa mba ọzọ.


“Ọ bụ ezie na unu bụ ndị na-akwa iko unu bụ Izrel, ma ka ikpe gharakwa ịma Juda. “Unu agakwala Gilgal, unu agakwala ruo Bet-Aven, unu aṅụkwala iyi sị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ.’


“Ana m ezipu unu dị ka atụrụ nʼetiti agụ. Ya mere, nweenụ uche dịka agwọ. Burunu ndị a na-apụghị ịta ụta dịka nduru.


Kpachapụnụ anya otu unu si ebi ndụ unu. Unu ebila ndụ dị ka ndị nzuzu, kama bienụ ndụ dị ka ndị maara ihe.


Eze Jeriko, otu eze Ai (nke dị nso na Betel), otu


Oke ala ha nʼakụkụ ugwu sitere nʼosimiri Jọdan ruo nʼakụkụ ugwu Jeriko. Nʼọdịda anyanwụ o sitere na Jeriko ruo ala ugwu ugwu ahụ niile, ruokwa nʼọzara Bet-Aven.


Joshua nwa Nun sitere na Shitim zipụ ndị nnyopụta abụọ na nzuzo sị ha, “Gaanụ leta otu ihe si aga nʼala ahụ, karịsịa nʼobodo Jeriko.” Ha gara nʼobodo ahụ baa nʼụlọ nwanyị akwụna aha ya bụ Rehab nọọ ọnọdụ nʼebe ahụ.


Mgbe ha lọghachiri azụ, ha gwara Joshua sị ya, “Ai bụ obodo nta. Ọ gaghị ewe karịa puku mmadụ abụọ maọbụ atọ imeri obodo ahụ. Ọ bakwaghị uru ka anyị niile gaa tigbuo obodo a, nʼihi na ha dị mmadụ ole na ole.”


Ndị Filistia nʼonwe ha chịkọtara ndị agha ha ibuso ndị Izrel agha. Ọnụọgụgụ ụgbọ agha ha dị puku atọ, ndị na-agba ịnyịnya ha nwere dị puku isii; ndị agha ha ndị ọzọ dị ukwu nʼọnụọgụgụ. Nʼezie, ha dị ukwuu dịka aja dị nʼọnụ osimiri. Ha manyere ụlọ ikwu ha na Mikmash nʼọwụwa anyanwụ Bet-Aven.


Ya mere, Onyenwe anyị napụtara ndị Izrel nʼụbọchị ahụ. E buru agha ahụ gabiga Bet-Aven.


O zigara ha nye ndị bi na Betel, Ramọt Negev na Jatịa,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan