Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 7:13 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 “Bilie! Doo Izrel nsọ. Gwa ndị m okwu sị ha, ‘Onye ọbụla nʼetiti unu ga-ejikere doo onwe ya nsọ maka echi. Nʼihi na Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-ekwu sị, Ihe ndị e doro nsọ dị nʼetiti unu, Izrel. Unu apụghịkwa iguzosi ike nʼihu ndị iro unu, tutu ruo mgbe unu ga-esite nʼetiti onwe unu wezuga ihe ndị ahụ.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

13 Bilie, do ndim nsọ, si, Donu onwe-unu nsọ bayere echi: n'ihi na otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Ihe ewezugara nyem di n'etiti gi, Israel: i pughi iguzosi ike n'iru ndi-iro-gi, rue mb͕e unu gēwezuga n'etiti onwe-unu ihe ahu ewezugara nyem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 7:13
13 Iomraidhean Croise  

Mgbe ahụ ụmụ ndị ikom Jekọb niile bịakwasịrị ndị a e gburu egbu, kwakọọ ihe niile dị nʼobodo ahụ niile, nʼihi mmerụ e merụrụ nwanne ha nwanyị.


Ugbu a, unu na-achọkwa ime ndị ikom na ndị inyom Juda na Jerusalem ndị ohu unu? Ma unu abụghị ndị ikpe mmehie mara nʼebe Onyenwe anyị Chineke unu nọ?


Onye ihu abụọ! Buru ụzọ wepụ obodobo osisi dị gị nʼanya ka i nwee ike ịhụzi ụzọ tụpụ ntakịrị ahịhịa nke dị nwanna gị nʼanya.


Ọ bụrụ na ezi enyi gị maọbụ nwanne gị nwoke maọbụ nwa gị nwoke maọbụ nwunye gị ị hụrụ nʼanya ejiri aghụghọ gwa gị okwu sị gị, “Bịa ka anyị gaa fee chi ndị ọzọ ofufe” (bụ chi ndị ị na-amaghị maọbụ nke nna gị ha na-amaghị,


Joshua gwara ndị Izrel sị, “Doonụ onwe unu nsọ, nʼihi na echi ka Onyenwe anyị ga-eme oke ihe ebube dị iche iche nʼetiti unu.”


Ma unu onwe unu, wezuganụ onwe unu pụọ nʼebe ihe ndị a kwadoro mbibi dị, ka unu gharakwa iweta ịla nʼiyi nye onwe unu site na iwere ihe ọbụla nʼime ha. Ma ọ bụghị otu a, unu ga-eme ka mbibi dakwasị ụlọ ikwu ụmụ Izrel niile.


Izrel emehiela. Ha emebiela ọgbụgba ndụ m nyere ha nʼiwu idebe, ha ewerela ụfọdụ nʼime ihe ndị ahụ e doro iche nye Onyenwe anyị. Ọ bụghị naanị na ha zuru ohi, ha nọkwa nʼelu ya ghaa ụgha banyere ya. Ha ewerekwala ihe ndị ahụ tinyekọta nʼihe nke aka ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan