Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 6:4 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ndị nchụaja asaa, ndị ga-eji opi mpi ebule asaa ga-ebu ụzọ gawa nʼihu. Ndị nchụaja ndị ọzọ ga-ebu igbe ọgbụgba ndụ. Nʼụbọchị nke asaa, unu ga-agba obodo ahụ gburugburu ugboro asaa. Mgbe unu na-eme nke a, ndị nchụaja asaa ahụ ga na-afụ opi mpi ebule ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

4 Ndi-nchu-aja asa gēbu kwa opì-ike oké uda asa n'iru ib͕e ahu: ma n'ubọchi nke-asa unu gāb͕a obodo ahu buruburu ub͕ù asa, ndi-nchu-aja gāfù kwa opì-ike asa ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 6:4
33 Iomraidhean Croise  

Chineke gọziri ụbọchị nke asaa ahụ mee ya ka ọ bụrụ ụbọchị dị nsọ, nʼihi na ọ bụ nʼụbọchị ahụ ka ọ zuru ike site nʼọrụ nke ike ihe niile.


Nʼoge a, ọ gwara nwokorobịa na-ejere ya ozi sị ya, “Gaa lee anya nʼụzọ oke osimiri.” Ọ rịgoro lee anya, sị, “Ọ dịghị ihe ọbụla m hụrụ.” Ịlaịja gwakwara ya otu a, ugboro asaa, sị ya, “Jeghachi.”


Ịlaisha zigara onyeozi ya nke bịara zie sị ya, “Jee saa ahụ gị ugboro asaa nʼosimiri Jọdan. I mee nke a, ekpenta ahụ ga-esi nʼakụkụ ahụ gị niile pụọ. Ị ga-adịkwa ọcha.”


Ya mere, ọ gara sụnye onwe ya nʼime osimiri Jọdan ugboro asaa, dịka onye nke Chineke gwara ya. Anụ ahụ ya lọghachiri dị ọcha ka anụ ahụ nwantakịrị.


Chineke nọnyeere anyị. Ọ bụkwa onyendu anyị. Ndị nchụaja ya ga-eji ịfụ opi ike tie mkpu agha megide unu. Unu ndị Izrel, unu alụsokwala Onyenwe anyị bụ Chineke nna unu ha ọgụ nʼihi na mmeri agaghị abụ nke unu!”


Ọ bụghị unu ka ọ dịrị ịlụ agha a, kama werenụ ọnọdụ unu, guzosienụ ike ka unu jiri anya unu hụ nzọpụta Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-enye unu, unu ndị Juda na Jerusalem. Unu atụla egwu, unu adakwala mba. Pụkwuru ha nʼihu agha mgbe chi echi bọrọ, Onyenwe anyị ga-anọnyekwara unu.’ ”


Mgbe ahụ kwa, ndị Livayị si nʼagbụrụ Kohat na Kora jiri ike ha niile too Onyenwe anyị Chineke Izrel nʼabụ.


Mgbe ya na ndị ya gbasịrị izu, Jehoshafat họpụtara ndị ikom ndị ga-eji abụ too Onyenwe anyị nʼihi ebube ya na ịdị nsọ ya. Mgbe ha na-aga nʼihu ndị agha, ha na-abụ abụ na-asị: “Nyenụ Onyenwe anyị ekele, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo ebighị ebi.”


Ugbu a, werenụ oke ehi asaa na ebule asaa, jekwuru ohu m bụ Job ka o jiri ha chụọrọ unu aja nsure ọkụ, ohu m bụ Job ga-ekpekwara unu ekpere. Aga m anabatakwa ekpere ọ ga-ekpe nʼihi unu. Agaghị m alakwa unu nʼiyi nʼihi okwu nzuzu unu. Unu ekwughị ihe ziri ezi banyere m dịka ohu m Job si kwuo.”


Nʼụbọchị ahụ, opi ike ga-ada. Ndị ahụ na-ala nʼiyi nʼAsịrịa na ndị ahụ e mere ka ha gaa biri nʼIjipt dịka ndị mba ọzọ ga-abịa fee Onyenwe anyị ofufe nʼugwu nsọ ya dị na Jerusalem.


ọ ga-arụnye otu mkpịsịaka nri ya nʼime mmanụ dị nʼọbụaka ya, ọ ga-ewere mkpịsịaka ya fesa ụfọdụ nʼime ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị.


Ọ ga-edenye mkpịsịaka ya nʼime ọbara ahụ, fesa ya ugboro asaa nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu akwa mgbochi nke ebe nsọ ahụ.


Ọ sịrị m, “Gịnị ka ị na-ahụ?” Asịrị m, “Ana m ahụ ihe ịdọba oriọna e ji ọlaedo mee. O nwere ọkwa nʼisi ya, nweekwa oriọna asaa, nke na-enwu nʼelu ya. Oriọna asaa ndị a nwekwara okporo asaa e si agbanye mmanụ nʼime ha.


Ọ sịrị m, “Nke a bụ okwu nke Onyenwe anyị nye Zerubabel. ‘Ọ bụghị site nʼike, maọbụ site nʼume, kama ọ bụ site na Mmụọ m,’ ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru.


Belam sịrị, “Wuoro m ebe ịchụ aja asaa nʼebe a. Kwadokwaara m oke ehi asaa na ebule asaa.”


Ndị nchụaja asaa ahụ bu opi ike asaa ndị ahụ, na-aga nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, na-afụ opi ike ha na-esepụghị aka. Ndị agha nọ nʼihu ha, ebe ndị nche na-eso ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị nʼazụ, nʼoge niile a a na-afụ opi ike ndị a na-esepụghị aka.


Gị na ndị agha gị zọọnụ ije gburugburu obodo a. Unu ga-ejegharị gburugburu mgbidi obodo a otu ugbo nʼụbọchị. Unu ga-esi otu a jegharịa ụbọchị isii.


Emesịa, ndị nchụaja ga-afụsi opi ahụ ike otu ugbo ọzọ, ha ga-afụ ya ka ọ daa ụda nke ukwu. Mgbe mmadụ niile nụrụ ụda opi a, ha niile ga-eti mkpu nke ga-ada ezi ụda. Nke a ga-eme ka mgbidi obodo ahụ daa. Mgbe ahụ, onye agha ọbụla ga-esite nʼebe ọbụla ọ nọ banye nʼime obodo ahụ.”


Nke a bụ ihe omimi nke kpakpando asaa ahụ ị hụrụ nʼaka nri m, na ihe ịdọba oriọna asaa ndị ahụ pụtara. Kpakpando asaa ahụ bụ ndị mmụọ ozi ụlọ nzukọ asaa ahụ. Osisi oriọna asaa ahụ bụ ụlọ nzukọ ndị ahụ nʼonwe ha.


Ọ bụ m Jọn na-ede akwụkwọ a, Na-edere ya nzukọ asaa dị na mpaghara Eshịa: Ka amara na udo nke sitere na Onye ahụ na-adị, Onye ahụ dịkwaarị, na Onye ahụ na-aga ịbịa dịrị unu, sitekwa nʼebe Mmụọ asaa ahụ na-eguzo nʼihu ocheeze ya,


O ji oke olu, nke dara ụda dịka ịgbọ ụja ọdụm, tie mkpu, egbe eluigwe asaa gbara otu mgbe ahụ.


Ahụkwara m ihe ịrịbama ọzọ nʼeluigwe. Ọ dị ebube dịkwa oke egwu. Ndị mmụọ ozi asaa ji ụzọ ahụhụ asaa. Ha bụ ahụhụ nke ikpeazụ ndị ga-eweta iwe Chineke na ngwụcha.


Otu nʼime anụ anọ ndị ahụ dị ndụ bunyere mmụọ ozi asaa ndị ahụ efere ọlaedo asaa a gbajuru ọnụma Chineke, bụ onye ahụ na-adị ndụ mgbe niile ebighị ebi.


Mgbe ahụ, anụrụ m oke olu si nʼụlọnsọ ahụ na-ada na-agwa ndị mmụọ ozi asaa ahụ okwu, “Ngwanụ, gaanụ wụsa ihe dị nʼefere ọnụma asaa Chineke ahụ nʼelu ụwa.”


Mgbe ahụ, ahụrụ m akwụkwọ e dere ihe ihu na azụ, nke a fụkọrọ afụkọ, kakwasịkwa ya akara asaa, ka ọ dị nʼaka nri onye ahụ nọkwasịrị nʼelu ocheeze ahụ.


Mgbe ahụ, ahụrụ m Nwa Atụrụ na-eguzo nʼetiti ocheeze ahụ dịka e gburu ya egbu. Anụ anọ ahụ dị ndụ na ndị okenye ahụ gbara ya gburugburu. O nwekwara mpi asaa na anya asaa, nke bụ mmụọ asaa nke Chineke, ndị e zipụrụ nʼime ụwa niile.


Ahụrụ m ndị mmụọ ozi asaa, ndị na-eguzo nʼihu Chineke. E nyere ha opi ike nʼotu nʼotu.


Mgbe ahụ, ndị mmụọ ozi asaa ahụ ndị ji opi asaa ahụ jikeere onwe ha ịfụ opi ike ahụ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan