Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 5:13 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Mgbe Joshua nọ nso obodo Jeriko, o weliri anya ya elu hụ otu nwoke ka o guzo nʼihu ya. Nwoke a mịpụtara mma agha ya jide ya nʼaka ya. Joshua jekwuru ya jụọ ya sị ya, “Ị dịnyeere anyị ka ị dịnyeere ndị iro anyị?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

13 O rue, mb͕e Joshua nọ n'akuku Jeriko, na o weliri anya-ya abua, we hu, ma, le, otù nwoke nēguzo na ncherita-iru ya, mma-agha-ya amiputara amiputa di n'aka-ya: Joshua we jekuru ya, si ya, Ọ̀ bu ayi ka i diri ma-ọbu ndi nēmegide ayi?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 5:13
24 Iomraidhean Croise  

Onyenwe anyị gosiri Ebraham onwe ya nʼakụkụ osisi ukwu dị na Mamre, mgbe Ebraham nọdụrụ ala nʼihu ụlọ ikwu ya, nʼetiti ehihie.


O lelitere anya ya hụ ndị ikom atọ ka ha guzo ebe ọ nọ nso. Mgbe ọ hụrụ ha, o sitere nʼihu ụlọ ikwu ya gbakwuru ha izute ha, kpọọ isiala.


Jekọb tetara nʼụra sị, “Nʼezie Onyenwe anyị nọ nʼebe a. Ma amaghị m ya.”


Jekọb lepụrụ anya nʼihu, hụ Ịsọ ka ọ na-abịa, ya na narị ndị ikom anọ ndị so ya. Nʼihi ya, o kesara ụmụntakịrị ndị ahụ, nʼetiti Lịa, na Rechel na ndị odibo nwanyị ya abụọ.


Mgbe Ịsọ lelitere anya hụ ndị inyom ndị a na ụmụntakịrị ndị ahụ. Ọ sịrị, “Ndị ole bụ ndị a gị na ha so?” Jekọb sịrị, “Ha bụ ụmụ Chineke sitere nʼamara ya nye ohu gị.”


Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ọtụtụ ndị ikom na-agbafeta soro Devid, tutu ruo mgbe ha ghọrọ igwe ndị agha, ndị agha nke Chineke.


Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere mmụọ ozi ahụ iwu ka o tinyekwa mma agha ya nʼọbọ ya.


Ma Devid ejerughị ebe ahụ ịjụta Chineke ase, nʼihi na ụjọ tụrụ ya mgbe ọ hụrụ mma agha ahụ dị nʼaka mmụọ ozi Onyenwe anyị.


Mmụọ ozi m ga-ejekwa nʼihu unu, ịkpọbatakwa unu nʼala ndị Amọrait, na ndị Het, na ndị Periz, na ndị Kenan, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Aga m ehichapụ obodo ndị a niile.


eleliri m anya m elu, hụ nʼihu m otu nwoke yi uwe akwa ọcha, onye e kekwasịrị belịt e ji ọlaedo sitere Ụfaz mee nʼukwu ya.


Eweliri m anya elu, hụ otu ebule nwere mpi ogologo abụọ ka o guzo nʼakụkụ iyi, otu nʼime mpi abụọ ya ahụ bidoro ito ogologo karịa nke ọzọ.


Nʼabalị ahụ, ahụrụ m nʼọhụ, otu nwoke na-agba ịnyịnya na-acha ọbara ọbara. O guzokwa nʼetiti osisi mietul, nke dị nʼebe miri emi nke mgbawa dị nʼala. Nʼazụ ya, ọtụtụ ịnyịnya na-acha ọbara ọbara, ndị na-acha ka ahịhịa kpọrọ nkụ, na ndị na-acha ọcha dịkwa.


Mgbe ịnyịnya ibu ahụ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị ka o guzochiri nʼụzọ, jide mma a mịpụtara amịpụta nʼaka ya, ịnyịnya ibu ahụ chigharịrị onwe ya hapụ okporoụzọ, tinye isi nʼọhịa. Ma Belam tiri ya ihe ịchụghachi ya nʼụzọ.


Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị meghere anya Belam. Ọ hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị ka o ji mma agha ya guzochie ụzọ. Belam dara nʼala, gbatịa onwe ya nʼala nʼihu ya.


Mgbe ha na-elegidesi anya ike nʼeluigwe dịka ọ na-ala, na mberede, ụmụ nwoke abụọ yi uwe ọcha guzooro ha nso.


Ma Onyenwe anyị gwara Joshua sị, “Lee, enyefela m obodo a bụ Jeriko, ya na eze ya, na ndị dị ike ibu agha nọ nʼime ya, nʼaka gị.


Nʼetiti ihe ịdọba oriọna ndị a, ahụrụ m otu onye yiri nwa nke mmadụ, ka o guzo. O yikwasịrị onwe ya uwe mwụda. Ma o nwere ihe okike na-acha ọlaedo e ji kee gburugburu obi ya.


Manoa biliri, soro nwunye ya. Mgbe o bịarutere ebe nwoke ahụ nọ, ọ jụrụ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ gị bụ nwoke ahụ gwara nwunye m okwu nʼoge gara aga?” Ọ zara sị ya, “E, ọ bụ m.”


Manoa gwara nwunye ya sị, “Anyị abụrụla ndị nwụrụ anwụ, nʼihi na anyị ahụla Chineke!”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan