Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 4:14 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị Onyenwe anyị buliri Joshua elu nke ukwuu nʼihi na o mere Joshua ka ọ dị ukwuu nʼanya ndị Izrel niile, si otu a mee ka ha tụọ ya egwu nke ukwuu dịka ha si tụọ Mosis egwu, ma sọpụkwara ya ụbọchị niile nke ndụ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

14 N'ubọchi ahu ka Jehova mere Joshua ka ọ di uku n'anya Israel nile; ha we tua egwu ya, dika ha turu egwu Moses, ubọchi nile nke ndu-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 4:14
14 Iomraidhean Croise  

Mgbe ndị Izrel niile nụrụ otu eze si kpebie ikpe a, ha sitere nʼịtụ egwu nye eze nsọpụrụ, nʼihi na ha hụrụ na o si nʼaka Chineke nweta amamihe ikpe ikpe ziri ezi.


Mgbe ndị amụma ahụ si Jeriko nʼele anya, hụrụ ihe mere, ha sịrị, “Mmụọ Ịlaịja adakwasịla Ịlaisha.” Ha gara zute ya, kpọọ isiala nʼihu ya.


Onyenwe anyị mere ka Solomọn dị ukwuu hie nne nʼanya ndị Izrel niile. Ọ yikwasịrị ya ebube nke alaeze nʼụdị ọ dịbeghị eze ọbụla buru ya ụzọ chịa nʼIzrel nweturula.


Ma aka Chineke dịnyere ndị Juda inye ha otu obi, ime ihe eze na ndịisi ya nyere nʼiwu, site nʼokwu Onyenwe anyị.


Onyenwe anyị mere ka ụmụ Izrel nweta ihuọma nʼebe ndị Ijipt, na ndị agbataobi ha nọ. Nke ka nke, Mosis ghọrọ onye a na-asọpụrụ nʼetiti ndị ozi Fero na nʼihu ndị Ijipt niile.


Ụmụ Izrel tụrụ egwu Onyenwe anyị mgbe ha hụrụ ihe ịrịbama ndị a Onyenwe anyị ji zọpụta ha site nʼaka ndị Ijipt. Ha kwenyere na Onyenwe anyị, kwenyekwa na Mosis ohu ya.


Nwa m, tụọ egwu Onyenwe anyị na onye bụ eze, esonyerela ndị ozi na-enupu isi megide nna ha ukwu.


Nʼihi na ọ bụ onyeozi Chineke maka ọdịmma nke gị, ma ọ bụrụ na unu mere ihe na-adịghị mma, tụọnụ egwu, nʼihi na onye na-achị achị nwere ezi nkwado ịta onye mere ihe ọjọọ ahụhụ. Ọ bụ onyeozi Chineke bụrụkwa onye na-eji ọnụma na-ata ndị mmebi iwu ahụhụ.


Nʼime igwe ojii ahụ, na nʼime osimiri ahụ e tinyere ha niile na baptizim, dịka ndị na-eso ụzọ Mosis.


Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua sị, “Taa, ka m ga-amalite ime ka ị dị ukwuu nʼanya ụmụ Izrel niile, ka ha niile mata na dịka m si nọnyere Mosis, otu a ka m ga-esi nọnyere gị.


Ndị agha ọnụọgụgụ ha ruru iri puku anọ (40,000), ndị jikeere nke ọma ibu agha, duuru ebo ndị ọzọ, gafere nʼihu Onyenwe anyị bata nʼobosara ala Jeriko maka ibu agha.


Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua okwu sị,


Mgbe ahụ Samuel kpọkuru Onyenwe anyị, Onyenwe anyị zidatakwara egbe eluigwe na mmiri ozuzo nʼụbọchị ahụ. Nke a mere ka mmadụ niile tụọ Onyenwe anyị na Samuel egwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan