Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 4:13 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Ndị agha ọnụọgụgụ ha ruru iri puku anọ (40,000), ndị jikeere nke ọma ibu agha, duuru ebo ndị ọzọ, gafere nʼihu Onyenwe anyị bata nʼobosara ala Jeriko maka ibu agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

13 dika orú nnù uzọ ise, ndi ejikere nke usu-ndi-agha, gabigara n'iru Jehova ibu agha, rue ala ihe nādighi nke Jeriko.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 4:13
11 Iomraidhean Croise  

Ma ndị agha Kaldịa chụsoro eze nʼazụ, chụkwute ya na mbara ala Jeriko. Ndị agha ya niile sitere nʼebe ọ nọ gbasasịa, hapụ ya,


Ya mere, Chineke duuru ha ga nʼụzọ Osimiri Uhie, nke gara nʼụzọ nke ọzara. Ụmụ Izrel kwadokwara akwado ibu agha mgbe ha si nʼala Ijipt pụọ.


Ma ndị agha ndị Babilọn chụsoro ha nʼazụ, chụkwute Zedekaya na mbara ala Jeriko. Ha jidere ya, kpụgara ya Nebukadneza eze Babilọn, nʼobodo Ribla, nke dị nʼala Hamat, ebe ọ nọ maa ya ikpe.


Ma usuu ndị agha Babilọn chụsoro Zedekaya bụ eze nʼazụ, chụkwute ya na mbara ala Jeriko. Ndị agha ya niile sitere nʼebe ọ nọ gbasasịa, hapụ ya,


Ma anyị onwe anyị ga-eburu ngwa agha anyị, buru ndị Izrel niile ọzọ ụzọ gaa nʼihu ịlụ ọgụ, tutu anyị edubata ha nʼala nke ha ga-eketa. Ma ndị nwunye anyị na ụmụntakịrị anyị ga-anọ nʼobodo e wusiri ike, ikpuchite ezinaụlọ anyị niile site nʼaka ndị iro bi anyị gburugburu.


Yikwasịnụ ngwa agha niile Chineke ka unu nwee ike iguzosi ike megide nzube ọjọọ niile nke ekwensu.


Enyekwara m unu iwu nʼoge ahụ sị, “Onyenwe anyị Chineke unu enyela unu ala a ka unu nwere ya. Ma ndị unu niile, ndị bụ dimkpa, ndị jikeere maka agha, ga-agafe nọrọ ndị Izrel ndị ọzọ nʼihu.


Ndị agha ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase, buuru ụmụ Izrel niile ụzọ gafee, idu ha nʼagha, dịka Mosis nyere ha nʼiwu.


Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị Onyenwe anyị buliri Joshua elu nke ukwuu nʼihi na o mere Joshua ka ọ dị ukwuu nʼanya ndị Izrel niile, si otu a mee ka ha tụọ ya egwu nke ukwuu dịka ha si tụọ Mosis egwu, ma sọpụkwara ya ụbọchị niile nke ndụ ya.


Mgbe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha na Gilgal nʼala ihe nʼadịghị nke Jeriko, ha mere Mmemme Ngabiga nʼuhuruchi nke ụbọchị iri na anọ nke ọnwa ahụ.


Mgbe ahụ, ndị Izrel niile ndị si nʼala Dan ruo Bịasheba, tinyere ndị si nʼala Gilead, pụtara dịka otu mmadụ, bịa zukọọ nʼihu Onyenwe anyị na Mizpa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan