Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 4:12 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ndị agha ụmụ Ruben, na ụmụ Gad, na ọkara ebo Manase, buuru ụmụ Izrel niile ụzọ gafee, idu ha nʼagha, dịka Mosis nyere ha nʼiwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

12 Umu Reuben, na umu Gad, na nkera ebo Manase, we gabiga n'iru umu Israel, chiri ihe-ekike-agha, dika Moses gwara ha okwu:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 4:12
9 Iomraidhean Croise  

Ya mere, Chineke duuru ha ga nʼụzọ Osimiri Uhie, nke gara nʼụzọ nke ọzara. Ụmụ Izrel kwadokwara akwado ibu agha mgbe ha si nʼala Ijipt pụọ.


Site nʼụmụ Gad, ndị ikom niile gbara iri afọ abụọ gbagoo, ndị tozuru ije agha ka e dere aha ha nʼusoro nʼotu nʼotu dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.


Ma anyị onwe anyị ga-eburu ngwa agha anyị, buru ndị Izrel niile ọzọ ụzọ gaa nʼihu ịlụ ọgụ, tutu anyị edubata ha nʼala nke ha ga-eketa. Ma ndị nwunye anyị na ụmụntakịrị anyị ga-anọ nʼobodo e wusiri ike, ikpuchite ezinaụlọ anyị niile site nʼaka ndị iro bi anyị gburugburu.


Enyekwara m unu iwu nʼoge ahụ sị, “Onyenwe anyị Chineke unu enyela unu ala a ka unu nwere ya. Ma ndị unu niile, ndị bụ dimkpa, ndị jikeere maka agha, ga-agafe nọrọ ndị Izrel ndị ọzọ nʼihu.


Ọ họọrọ ala nke kachasị mma nye onwe ya; oke ruuru onyendu ka e wepụrụ dobere ya. Mgbe ndị ndu ndị mmadụ zukọrọ, o mezuru ezi ihe dị Onyenwe anyị nʼobi, na ikpe ya niile banyere Izrel.”


Kama ndị nwunye unu, na ụmụntakịrị unu, na anụ ụlọ unu, ga-anọ nʼala a dị nʼọwụwa anyanwụ nke Mosis nyere unu. Ma ndị agha unu, ndị jikeere ejike, ga-eduru ndị Izrel ndị ọzọ gafee osimiri Jọdan inyere ụmụnna ha aka,


Ngwangwa ha niile gafetasịrị, igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na ndị nchụaja gafetakwara nʼakụkụ nke ọzọ, ka ndị mmadụ na-ele ha anya.


Ndị agha ọnụọgụgụ ha ruru iri puku anọ (40,000), ndị jikeere nke ọma ibu agha, duuru ebo ndị ọzọ, gafere nʼihu Onyenwe anyị bata nʼobosara ala Jeriko maka ibu agha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan