Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 3:8 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ị ga-enye ndị nchụaja bụ ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ iwu si, ‘Mgbe unu ruru nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan, banyekwanụ gaa guzo nʼime osimiri ahụ.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

8 Gi onwe-gi gēnye kwa ndi-nchu-àjà ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu ahu iwu, si, Mb͕e unu gābiaru nsọtu miri Jọdan, unu gēguzo na Jọdan.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 3:8
20 Iomraidhean Croise  

Mgbe ahụ, Ịlaịja sịrị ya, “Nọdụ nʼebe a, nʼihi na Onyenwe anyị ziri m ka m jee Jọdan.” Ma ọ zara, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, na dịka gị onwe gị nọkwa na-adị ndụ, agaghị m ahapụ gị.” Ya mere, ha abụọ sooro na-eje.


Mgbe ha kpọkọtara ụmụnna ha bụ ndị Livayị, dokwaa onwe ha ọcha, ha bara ido ụlọnsọ Onyenwe anyị nsọ, dịka eze nyere nʼiwu, nʼusoro okwu Onyenwe anyị si dị.


Hezekaya nyere iwu ka a chụọ aja nsure ọkụ ahụ nʼelu ebe ịchụ aja. Mgbe a malitere isure aja ahụ ọkụ, a malitekwara ịbụ abụ nye Onyenwe anyị, na ịfụ opi na iti ihe egwu niile nke Devid, eze Izrel.


Eze Hezekaya na ndịisi ozi ya nyere iwu ka ndị Livayị bụọ ụfọdụ nʼime abụ ọma Devid, na nke Asaf onye amụma, maka iji ya too Onyenwe anyị. Ha mere otu a, kpọọkwa isiala nye Chineke.


Ma aka Chineke dịnyere ndị Juda inye ha otu obi, ime ihe eze na ndịisi ya nyere nʼiwu, site nʼokwu Onyenwe anyị.


Mgbe ahụ, enyere m ndị Livayị iwu ka ha doo onwe ha ọcha, nọọkwa na nche nʼọnụ ụzọ ama, ịhụ na onye ọbụla doro ụbọchị izuike nsọ. Chineke m, biko, cheta m nʼihi ihe ọma ndị a niile, nwee amara nʼebe m nọ, dịka ịba ụba nke obi ebere gị si dị.


Ya mere, esitere m nʼebe m nọ chụpụ otu nʼime ụmụ ndị ikom Joiada, nwa Eliashib, onyeisi nchụaja, onye bụ ọgọ Sanbalat onye Hor.


Mosis zaghachiri ha sị, “Unu atụla egwu. Guzosienụ ike. Unu ga-ahụ ụzọ dị ebube Onyenwe anyị ga-esi zọpụta unu taa. Ndị Ijipt a unu na-ahụ taa, unu agaghị ahụkwa ha ọzọ.


Ọ bụ ihe dị mma iji nwayọọ chere nzọpụta nke Onyenwe anyị.


Ndị nchụaja bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị guzoro nʼala akọrọ nʼetiti Jọdan, Izrel niile gabigakwara tutu ruo mgbe mba ahụ niile gafesịrị nʼala akọrọ.


nye ha iwu sị, “Mgbe unu hụrụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu, ka ndị nchụaja, ụmụ Livayị, bulitere ya, unu onwe unu ga-esi nʼebe unu nọ bilie soro ha nʼazụ.


Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua sị, “Taa, ka m ga-amalite ime ka ị dị ukwuu nʼanya ụmụ Izrel niile, ka ha niile mata na dịka m si nọnyere Mosis, otu a ka m ga-esi nọnyere gị.


Mgbe ahụ, Joshua gwara ụmụ Izrel niile sị, “Bịanụ nso, bịanụ nụrụ okwu niile nke Onyenwe anyị Chineke unu.


Ngwangwa ha niile gafetasịrị, igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na ndị nchụaja gafetakwara nʼakụkụ nke ọzọ, ka ndị mmadụ na-ele ha anya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan