Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 3:7 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua sị, “Taa, ka m ga-amalite ime ka ị dị ukwuu nʼanya ụmụ Izrel niile, ka ha niile mata na dịka m si nọnyere Mosis, otu a ka m ga-esi nọnyere gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

7 Jehova we si Joshua, Ta ka M'gāmalite ime ka i di uku n'anya Israel nile, ka ha we mara na otú M'nọyere Moses, otú a ka M'gānọyere gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 3:7
13 Iomraidhean Croise  

Onyenwe anyị mere ka Solomọn dị ukwuu hie nne nʼanya ndị Izrel niile. Ọ yikwasịrị ya ebube nke alaeze nʼụdị ọ dịbeghị eze ọbụla buru ya ụzọ chịa nʼIzrel nweturula.


Solomọn nwa Devid mere onwe ya ka o guzosie ike nʼalaeze ya, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke ya nọnyeere ya, meekwa ka ọ dị ukwuu hie nne.


“Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-agụ ya dịka ihe, i ji na-elenye anya nʼihe gbasara ya,


Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m, aka nri gị na-akwagidekwa m, inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu.


Mgbe Jisọs kwusiri okwu ndị a, o leliri anya nʼeluigwe sị, “Nna, oge ahụ a kara aka eruola, nye Ọkpara gị otuto, ka Ọkpara gị nyekwa gị otuto.


Nʼihi na olileanya m na ntụkwasị obi m bụ na ihere agaghị eme m nʼụzọ ọbụla, kama, aga m enwe ezi agbamume nke ga-eme ka e bulie Kraịst elu nʼahụ m, ma ugbu a ma mgbe niile, maọbụ na ndụ, ma ọ bụkwanụ nʼọnwụ.


Anyị ga-ege gị ntị dịka anyị si gee Mosis ntị. Ka Onyenwe anyị Chineke gị nọnyere gị dịka o si nọnyere Mosis.


Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ iguzo imegide gị ụbọchị niile nke ndụ gị. Aga m anọnyere gị dịka m si nọnyere Mosis. Agaghị m ahapụ gị aka. Agaghị m agbakụtakwa gị azụ.


Ọ bụ na m enyebeghị gị iwu sị gị, Nwee obi ike, dịrịkwa ike! Wezuga ụjọ niile na ịda mba nke obi. Cheta na mụ, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, nọnyeere gị ebe ọbụla ị na-aga.”


Joshua gwara ndị nchụaja sị ha, “Bulienụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, gabiga nʼihu ndị Izrel.” Ha buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ, bido ịga nʼihu ụmụ Izrel.


Ị ga-enye ndị nchụaja bụ ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ iwu si, ‘Mgbe unu ruru nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan, banyekwanụ gaa guzo nʼime osimiri ahụ.’ ”


Ụbọchị ahụ bụ ụbọchị Onyenwe anyị buliri Joshua elu nke ukwuu nʼihi na o mere Joshua ka ọ dị ukwuu nʼanya ndị Izrel niile, si otu a mee ka ha tụọ ya egwu nke ukwuu dịka ha si tụọ Mosis egwu, ma sọpụkwara ya ụbọchị niile nke ndụ ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan