Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 3:6 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Joshua gwara ndị nchụaja sị ha, “Bulienụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, gabiga nʼihu ndị Izrel.” Ha buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ, bido ịga nʼihu ụmụ Izrel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

6 Joshua we gwa ndi-nchu-àjà okwu, si, Bulienu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu-ahu, gabiga n'iru ndi Israel. Ha we bulie ib͕e ọb͕ub͕a-ndu ahu, we nēje n'iru ndi Israel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 3:6
11 Iomraidhean Croise  

Mgbe ndị okenye Izrel niile bịarutere, ndị nchụaja buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ.


Mgbe ndị okenye Izrel niile bịarutere, ndị Livayị buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ.


Onye ahụ na-egbuwa ụzọ ga-anọ nʼihu na-edu ha. Ha ga-etipukwa ọnụ ụzọ ama ahụ, ma site na ya gafee. Eze ha ga-agabigakwa nʼihu ha, Onyenwe anyị ga-anọ nʼisi.”


Ya mere ha sitere nʼugwu Onyenwe anyị bilie ije. Jeekwa ije abalị atọ. Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na-aga ha nʼihu ụbọchị atọ ndị ahụ niile ịchọtara ha ebe ha ga-akwụsị zuo ike.


Ma ugbu a, ọ bụrụ na i gbusie ndị gị a dum, mba niile nụrụla akụkọ ndị a banyere gị ga-asị,


ebe Jisọs onye buru anyị ụzọ, abanyela nʼihi anyị; ọ ghọlara anyị onyeisi nchụaja ruo mgbe ebighị ebi dị ka usoro Melkizedek si dị.


nye ha iwu sị, “Mgbe unu hụrụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu, ka ndị nchụaja, ụmụ Livayị, bulitere ya, unu onwe unu ga-esi nʼebe unu nọ bilie soro ha nʼazụ.


Joshua gwara ndị Izrel sị, “Doonụ onwe unu nsọ, nʼihi na echi ka Onyenwe anyị ga-eme oke ihe ebube dị iche iche nʼetiti unu.”


Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Joshua sị, “Taa, ka m ga-amalite ime ka ị dị ukwuu nʼanya ụmụ Izrel niile, ka ha niile mata na dịka m si nọnyere Mosis, otu a ka m ga-esi nọnyere gị.


Ya mere, Joshua nwa Nun kpọrọ ndị nchụaja sị ha, “Burunu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ, ka ndị nchụaja asaa nʼime unu werekwa opi mpi ebule buru ụzọ na-aga nʼihu ya.”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan