Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 3:3 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 nye ha iwu sị, “Mgbe unu hụrụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu, ka ndị nchụaja, ụmụ Livayị, bulitere ya, unu onwe unu ga-esi nʼebe unu nọ bilie soro ha nʼazụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

3 ha we nye ndi Israel iwu, si, Mb͕e unu nāhu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke-unu, na ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, ka ha nēbu ya, unu onwe-unu gēsi kwa n'ebe unu nọ bulie ije, we nējeso ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 3:3
20 Iomraidhean Croise  

Mgbe ndị bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ zọrọ nzọ ụkwụ isii; ọ na-eji oke ehi na nwa ehi gbara abụba chụọ aja.


Ha dọkwasịrị igbe Chineke ahụ nʼelu ụgbọala ọhụrụ ehi na-adọkpụ, buputa ya site nʼụlọ Abinadab nke dị nʼelu ugwu nta. Ọ bụ Ụza na Ahio, ụmụ Abinadab, na-edu ụgbọala ọhụrụ ahụ,


Mgbe ndị okenye Izrel niile bịarutere, ndị nchụaja buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ.


Ọ dịkwaghị mgbe a ga-ahapụ inweta onye ga-esite nʼetiti ndị nchụaja na ndị Livayị, nke ga-eguzo nʼihu m ụbọchị niile ịchụ aja nsure ọkụ, na i wetara m onyinye ịnata ihuọma, na ịchụrụ m aja dị iche iche.’ ”


Ya mere ha sitere nʼugwu Onyenwe anyị bilie ije. Jeekwa ije abalị atọ. Igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na-aga ha nʼihu ụbọchị atọ ndị ahụ niile ịchọtara ha ebe ha ga-akwụsị zuo ike.


“Mgbe Erọn na ụmụ ya kpuchisịrị ụlọnsọ ahụ na ngwongwo niile nke ebe nsọ ahụ, dịka ndị Izrel niile na-ejikere ibili ije, mgbe ahụ ka ndị Kohat ga-abata buru ihe ndị a. Ma ha agaghị emetụ ihe nsọ ndị a aka ka ha ghara ịnwụ. Ọrụ ibu ihe ndị a niile dị nʼime ụlọ nzute dịrị Ndị Kohat.


Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ ịbụ onye na-eso ụzọ m, ya buru ụzọ jụ onwe ya, buru obe ya, soro m nʼazụ.


Nʼoge ahụ, otu onye nʼetiti ndị na-ezi iwu bịakwutere ya sị ya, “Onye nkuzi, aga m eso gị gaa ebe ọbụla ị na-aga.”


o nyere ndị Livayị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị iwu sị ha,


Mgbe ahụ, Mosis depụtara iwu ndị ahụ niile nʼakwụkwọ, were ya nye ndị nchụaja, ụmụ Livayị, ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ. Mosis nyekwara ndị okenye Izrel akwụkwọ a e dere iwu niile.


Ma a ga-enwe oke nʼetiti unu na ha, ihe dịka otu kilomita site nʼebe igbe ọgbụgba ndụ ahụ dị. Unu agaghị abịaru ya nso. Nke a bụ maka ị mara ụzọ unu ga-eso, nʼihi na unu esibeghị nʼụzọ a gaa ije mbụ.”


Joshua gwara ndị nchụaja sị ha, “Bulienụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, gabiga nʼihu ndị Izrel.” Ha buliri igbe ọgbụgba ndụ ahụ, bido ịga nʼihu ụmụ Izrel.


Ị ga-enye ndị nchụaja bụ ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ iwu si, ‘Mgbe unu ruru nʼọnụ mmiri osimiri Jọdan, banyekwanụ gaa guzo nʼime osimiri ahụ.’ ”


Ndị nchụaja, ndị bụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ, guzoro nʼetiti osimiri Jọdan, tutu ruo mgbe e mezuru iwu ahụ niile Onyenwe anyị nyere Joshua site nʼọnụ Mosis. Mgbe ahụ kwa, ndị Izrel mere ngwangwa gafee osimiri Jọdan.


Ya mere, Joshua nwa Nun kpọrọ ndị nchụaja sị ha, “Burunu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ, ka ndị nchụaja asaa nʼime unu werekwa opi mpi ebule buru ụzọ na-aga nʼihu ya.”


Ndị a bụkwa ndị na-emerụghị onwe ha nʼebe ụmụ nwanyị dị, nʼihi na ha dị ọcha ka ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Ha na-eso Nwa Atụrụ ahụ ebe ọbụla ọ na-aga. Ha bụ ndị a gbapụtara nʼetiti mmadụ ịbụrụ Chineke na Nwa Atụrụ ahụ dịka mkpụrụ mbụ.


Ndị ikom Livayị nọ nʼebe ahụ buliri igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na igbe nta ahụ dị nʼakụkụ ya nke ọlaedo niile a kpụrụ akpụ dị nʼime ya, dọkwasị ha nʼelu nkume. Ndị Bet-Shemesh chụrụ ọtụtụ aja nsure ọkụ na aja ndị ọzọ nye Onyenwe anyị nʼụbọchị ahụ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan