Joshua 3:16 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a16 mmiri si nʼelu elu osimiri ahụ kwụsịrị ịsọ, ọ gara elu tụkọta onwe ya dịka mgbidi nʼebe dị anya, nʼobodo a na-akpọ Adam, nke dị nso obodo Zaretan. Ebe mmiri nke na-eruda na-asọbanye osimiri Araba, ya bụ, osimiri Nnu kwụsịrị ịsọ kpamkpam. Ya mere, ndị Izrel gabigara na ncherita ihu Jeriko. Faic an caibideilBible Nso16 na miri ahu nke nēsi n'elu rida guzoro, we bilie n'otù obo, n'ebe di anya nke-uku, n'Adam, bú obodo nke di n'akuku Zaretan: ebìpusi-kwa-ra miri nke nērudata rue osimiri Araba, bú Oké Osimiri Nnú: ndi Israel we gabiga na ncherita-iru Jeriko. Faic an caibideil |
Gịnị mere o ji bụrụ na o nweghị onye nọ ya mgbe m bịara? Gịnị mere o nweghị onye zara m mgbe m kpọrọ oku? Ọ pụtara na aka m dị mkpụmkpụ ịzọpụta unu? Ọ ga-abụ na m enwekwaghị ike ịzọpụta? Nʼihi na enwere m ike ịbara osimiri mba mee ya ka ọ ghọọ ala akọrọ. Enwere m ike ime ka osimiri ghọrọ ọzara, ka azụ niile dị nʼime ya nwụọ nʼihi enweghị mmiri.
Mgbe ndị eze ndị Amọrait niile, ndị bi nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan, nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, na ndị eze ndị Kenan niile bi nʼakụkụ oke osimiri Mediterenịa, nụrụ na Onyenwe anyị emeela ka osimiri Jọdan takpọọ nʼihu ụmụ Izrel, ruo mgbe anyị niile gafesịrị, obi lọrọ ha mmiri. Ọ dịkwaghị ike ọbụla fọdụụrụ ha iguzo nʼihu ụmụ Izrel.