Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 24:2 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Mgbe ahụ, Joshua gwara ndị Izrel niile sị, “Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel kwuru, ‘Nna nna unu ochie ha, nke bụ Tera, nna Ebraham, na Nahọ, bikwara nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nke ofe osimiri Yufretis, ebe ha nọ fee chi ndị ọzọ ofufe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

2 Joshua we si ndi Israel nile, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, siri, N'ofè Osimiri ahu ka nna-unu-hà biri site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, bú Tira, nna Abraham, na nna Nehoa: ha we fè chi ọzọ di iche iche.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 24:2
16 Iomraidhean Croise  

Serug gbara iri afọ atọ mgbe ọ mụrụ Nahọ.


Nahọ gbara iri afọ abụọ na itoolu mgbe ọ mụrụ Tera.


Mgbe Tera gbara iri afọ asaa, ọ ghọrọ nna Ebram, Nahọ na Haran.


Nke a bụ akụkọ gbasara usoro ezinaụlọ Tera. Tera ghọrọ nna Ebram, Nahọ na Haran. Haran ghọrọ nna Lọt.


Ka Leban gara ịkpachapụ ajị ụmụ atụrụ ya, Rechel zuuru arụsị ezinaụlọ nna ya.


Ugbu a, ị na-ala nʼihi na ọ gụrụ gị agụụ ịlaghachi nʼụlọ nna gị, ma gịnị mere i ji zuru chi m?”


Ma ọ bụrụ na ị chọta onye ọbụla ji chi gị ndị a, onye ahụ ga-anwụ. Nʼihu ndị ikwu gị ndị a, chọgharịa nʼonwe gị, lee ma ị ga-achọta ihe ọbụla bụ nke gị dị m nʼaka. Ọ bụrụ na ị chọta ya, were ya.” Ma Jekọb amaghị na Rechel zuuru chi ndị ahụ.


Ka Chineke Ebraham na Chineke Nahọ, Chineke nna ha, bụrụ onye ikpe nʼetiti mụ na gị.” Ya mere Jekọb ji onye ahụ a na-atụ egwu nke nna ya Aịzik ṅụọ iyi.


Ya mere, ha nyere Jekọb chi ndị ala ọzọ niile ha ji nʼaka, na ọla niile dị ha na ntị. Jekọb chịịrị ha niile lie ha nʼokpuru osisi ook dị na Shekem.


na Ebram, ya bụ Ebraham.


Legidenụ Ebraham bụ nna unu na Sera anya, bụ ndị mụrụ unu. Ebraham nọ naanị ya mgbe m kpọrọ ya, ma a gọziri m ya, mee ka ọ ghọọ oke mba.


sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-agwa Jerusalem: Ịpụta ụwa gị na ọmụmụ gị bụ nʼala ndị Kenan; nna gị bụ onye Amọrị, nne gị bụ onye Het.


nwa Jekọb, nwa Aịzik, nwa Ebraham, nwa Tera, nwa Nahọ;


Mgbe ahụ, ị ga-ekwupụta nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị sị, “Nna nna m bụ onye Aram na-awagharị awagharị, onye jere Ijipt izere ndụ. Ha dị ole na ole mgbe ha gara Ijipt, ma nʼIjipt ha ghọrọ mba dị ukwuu, ndị dị ike, na ndị bara ụba nʼọnụọgụgụ.


Ọ bụrụkwanụ na ọ masịghị unu ife Onyenwe anyị, họpụtaranụ onwe unu taa onye unu ga-efe. Ma ọ bụ chi ndị ahụ nna nna unu ha fere nʼofe ọzọ nke osimiri, maọbụ chi ndị Amọrait, ndị unu bi nʼala ha. Ma nʼebe mụ onwe m na ezinaụlọ m nọ, anyị ga-efe Onyenwe anyị.”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan