Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 23:9 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 “Onyenwe anyị achụpụla mba dị ukwuu na mba siri ike site nʼebe unu nọ. O nwekwaghị otu mba nʼime ha o kwere ka ha merie unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

9 Jehova nānapu kwa mba uku nke nwere ume ala-ha n'iru unu: ma unu onwe-unu, ọ dighi nwoke ọ bula guzoworo n'iru unu rue ta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 23:9
14 Iomraidhean Croise  

Ehab bụ onye mere mmehie dị oke njọ nke ịgbaso na ife arụsị dị iche iche ofufe dịka ndị Amọrait mere, bụ ndị ahụ Onyenwe anyị sitere nʼala a chụpụ ime ka ndị Izrel nweta ala ha.)


O Chineke anyị, ọ bụghị gị onwe gị chụpụrụ ndị bi nʼala, site nʼihu ndị gị Izrel, were ya nye ụmụ ụmụ Ebraham, bụ enyi gị nwoke?


Mmụọ ozi m ga-ejekwa nʼihu unu, ịkpọbatakwa unu nʼala ndị Amọrait, na ndị Het, na ndị Periz, na ndị Kenan, na ndị Hiv, na ndị Jebus. Aga m ehichapụ obodo ndị a niile.


Ma aga m achụpụ ha nwantịntị nwantịntị, tutu ruo oge unu ga-adị ọtụtụ, mgbe ọnụọgụgụ unu ga-akarị nke ha ukwuu, mgbe unu ga-ejupụta ala ahụ niile.


Mgbe Joshua duuru nna nna anyị ha nweta ala ndị mba ọzọ ndị Chineke chụpụrụ. E butekwara igbe ọgbụgba ndụ a nʼala ahụ. Ọ nọgidekwara nʼala ahụ tutu ruo nʼoge Devid.


Onyenwe anyị ga-achụpụ mba niile bi nʼala ahụ unu na-aga inweta, unu ga-anapụkwa ha ala ahụ, ọ bụladị na ha buru ibu, siekwa ike karịa unu.


Eze ha niile ka ọ ga-enyefe nʼaka unu, unu ga-ehichapụkwa aha ha nʼelu ụwa. Ọ dịkwaghị onye pụrụ iguzo nʼihu unu, nʼihi na unu ga-ebibi ha niile.


Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ iguzo imegide gị ụbọchị niile nke ndụ gị. Aga m anọnyere gị dịka m si nọnyere Mosis. Agaghị m ahapụ gị aka. Agaghị m agbakụtakwa gị azụ.


Kaleb sitere nʼobodo Hebrọn chụpụ ndị ikom atọ, bụ Sheshai, na Ahiman, na Talmai, ụmụ Anak nʼala ha.


Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-akwapụ ndị bi nʼime ha nʼihi unu. Ọ ga-achụpụ ha nʼihu unu, mee ka unu nweta ala ha, dịka Onyenwe anyị Chineke unu kwere unu nkwa.


Kama raparanụ nʼahụ Onyenwe anyị Chineke unu dịka unu mere ruo taa.


Ọ bụ Onyenwe anyị chụpụrụ ndị Amọrị na ọtụtụ mba ndị ọzọ bi nʼala a. E, anyị onwe anyị ga-efe Onyenwe anyị, nʼihi na ọ bụ Chineke anyị.”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan