Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 22:8 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 “Werenụ ọtụtụ akụ unu lụtara nʼagha laa. Mgbe unu ruru, kenyenụ ndị ikwu unu ụfọdụ ihe site nʼime akụ ndị iro unu a.” Nʼihi na ihe ha kwatara nʼagha dị ukwuu: igwe anụ ụlọ, na ọlaọcha, na ọlaedo, na bronz, na igwe, na uwe dị iche iche.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

8 gwa ha okwu, si, Werenu ọtutu àkù laghachi n'ulo-ikwū-unu, were kwa anu-ulo bara uba nke-uku, were kwa ọla-ọcha, were kwa ọla-edo, were kwa ọla, were ígwè, were kwa uwe bara uba nke-uku: soronu umu-nne-unu kere ihe-nkwata ndi-iro-unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 22:8
12 Iomraidhean Croise  

Ha bụ ndị ọzụzụ atụrụ, nwekwa ọtụtụ igwe anụ ụlọ. Ọ bụkwa nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nʼọnụ ọzara ruo nʼosimiri Yufretis ka ha na-azụ ha, nʼihi na anụ ụlọ ha nwere bara ụba na Gilead.


Nʼihi nke a Onyenwe anyị mere ka ọchịchị ya guzosie ike. Ndị Juda niile tụkwara ụtụ ha dịka o kwesiri wetara Jehoshafat, nke a mere ka o nwee akụnụba ebe ọ dị ukwuu, nwekwa nsọpụrụ.


Ya mere, Hezekaya ghọrọ eze bara ọgaranya, bụrụkwa onye a na-asọpụrụ. O wuru ụlọakụ maka ichebe ọlaọcha ya na ọlaedo, na nkume dị oke ọnụahịa, na ụda na-esi isi ụtọ, na ọta na efere ọlaedo ya.


ndị eze na ndị agha ha ji ọsọ gbalaa; ndị mmadụ kere ihe a dọtara nʼagha, nʼime ọmụma ụlọ ikwu.


Ndụ ogologo dị nʼaka nri ya; nʼaka ekpe ya ka akụnụba na nsọpụrụ dịkwa.


Mgbe ahụ, kee ihe ndị a niile ụzọ abụọ. Ọkara ya ga-abụ nke ndị ikom ahụ niile gara agha, ma ọkara nke ọzọ ka a ga-enye ọgbakọ Izrel niile.


Ya mere, ụmụnna m ndị m hụrụ nʼanya, kwụsienụ ike, bụrụnụ akwaa akwụrụ. Nọgidenụ nʼọrụ Onyenwe anyị mgbe niile, ebe unu maara na ọrụ unu na-arụ nʼime Onyenwe anyị abụghị ihe efu.


O kpebiri na ọ bụ ihe karịchara mma ịhụ ahụhụ nʼihi Kraịst, kama inweju akụ niile nke Ijipt afọ. Nʼihi na o nwere olileanya maka ụgwọ ọrụ dị nʼihu.


O duuru ha jee nʼebe ndị Amalek nọ. Mgbe ha ruru ebe ahụ, ha hụrụ ha ebe ha tụsara onwe ha nʼala na-eri na-aṅụ, na-etekwa egwu ọṅụ, nʼihi ihe dị ukwuu ha kwatara nʼagha site nʼala ndị Filistia, na nʼala Juda.


Unu chere na ọ dị onye ga-ege unu ntị mgbe unu na-ekwu okwu dị otu a? Anyị niile ga-eketa oke; oke ndị jere agha na ndị chebere ihe anyị ga-abụ otu.”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan