Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Joshua 22:6 - Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ya mere, Joshua gọziri ha, zipụ ha, ha lakwara nʼụlọ nke aka ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Bible Nso

6 Joshua we gọzie ha, zilaga ha: ha we jerue ulo-ikwū-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Joshua 22:6
18 Iomraidhean Croise  

ọ gọziri Ebram sị ya, “Ngọzị dịrị Ebram site nʼaka Chineke nke kachasị ihe niile elu, Onye kere eluigwe na ụwa.


Jekọb gọziri Fero, site nʼihu ya pụọ.


Josef kpọtara nna ya Jekọb, mee ka o guzo nʼihu Fero. Jekọb nọ nʼebe ahụ gọzie Fero.


Mgbe ọ chụsịrị aja nsure ọkụ na aja udo ndị a, ọ gọziri ndị Izrel nʼaha Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.


O nyekwara onye ọbụla nʼetiti igwe ndị Izrel niile ahụ, ma nwoke ma nwanyị, otu ogbe achịcha, ọkpụrụkpụ anụ na achịcha mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ. Ndị a niile lara, onye ọbụla nʼụlọ nke ya.


Mgbe Devid lọtara ka ọ gọzie ndị ụlọ ya, Mikal, ada Sọl pụtara izute ya, sị, “Lee ka eze Izrel si mee onwe ya onye dị ukwuu taa! Ọ gbara onwe ya ọtọ na mbara, nʼihu ndị ohu nwanyị nke ndị odibo ya dịka mmadụ efu.”


Nʼụbọchị nke na-eso ya, o zilagara ndị ahụ niile. Ha gọziri eze, laakwa nʼụlọ ha, nʼịṅụrị ọṅụ na obi ụtọ nʼihi ihe ọma niile nke Onyenwe anyị meere ohu ya Devid, na ndị ya Izrel.


Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị sitere nʼIfrem, na Manase, na Isaka, na Zebụlọn edoghị onwe ha ọcha, ma ha sokwa rie oriri ngabiga ahụ, si otu a mebie ihe e dere nʼiwu. Ma Hezekaya kpeere ha ekpere sị, “Ka Onyenwe anyị onye dị mma gbaghara onye ọbụla


Mosis nʼonwe ya hụkwara ọrụ ndị a niile, nabata ya ka nke e jere dịka iwu Onyenwe anyị nyere si dị. Nʼihi ya, Mosis gọziri ha.


Mgbe ahụ, Simiọn gọziri ha, sịkwa Meri nne ya, Lee, “Nwatakịrị a bụ onye e zitere ka ọ bụrụ ọdịda na mbili nye ọtụtụ mmadụ nʼIzrel, ọ ga-abụkwa ihe ama nke ọtụtụ ga-ekwujọ.


O duuru ha garuo na Betani, chilie aka ya abụọ elu gọzie ha.


Nʼihi nke a, Joshua gọziri Kaleb nwa Jefune. O nyere ya obodo Hebrọn ka ọ bụrụ ihe nketa ya.


Emesịa, Joshua zilara onye ọbụla, ka ha laa nʼihe nketa nke aka ha.


Ọzọkwa, Samuel gwara ndị Izrel ihe bụ ọrụ eze, na ihe ruuru ya. O dekwara ihe ndị a nʼakwụkwọ, debe akwụkwọ ahụ nʼihu Onyenwe anyị. Emesịa, Samuel mechiri nzukọ ahụ. Onye ọbụla laghachikwara nʼụlọ ya.


Sọl sitere nʼetiti ụmụ Izrel họpụta puku ndị ikom atọ ka ha bụrụ ndị agha ya. Sọl na puku abụọ nọ na Mikmash nʼala ugwu ugwu Betel. Otu puku nọnyeere Jonatan na Gibea, nʼala Benjamin. Ndị ikom ndị fọdụrụ ka o zighachiri, onye ọbụla nʼụlọ ha.


Tupu ha alaa, Elayị na-agọzi Elkena na Hana sị, “Ka Onyenwe anyị nye gị ụmụ ọzọ, ndị ga-anọchi anya onye a ị rịọrọ maka ya, nke i nyeghachiri Onyenwe anyị.”


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan